‘Easter’: Obianọ akpọọla ndị ụka ka ha na-ebi ndụ ezi ndị otu Christ

0
515
Asusu Igbo

Izunna Okafor

 

AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ akpọkuola ndị ụka n’ụwa gbaa gburu gburu ka ha malite ibi ndụ ezi onye otu Christ ma gbakụtakwa ihe ọjọọ azụ.

Gọvanọ Obianọ kpọrọ oku a n’okwu ya na mmemme ịchụ aja ofufe dị nsọ e jiri merube ụbọchị ‘Easter’, bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ ụka Katọliki St Joseph dị n’Agụleri, bụ obodo ya bụ agụ nwoke.

Gọvanọ Obianọ jiri ohere ahụ wee sị ndị Anambra “Mmemme Isita Ọma”, ma mezie ka ha mara na Christ hụrụ onye ọbụla n’anya, wee ruo nke ịnwụ ọnwụ n’elu obe.

Na ntụnye nke ya, onye ode akwụkwọ ukwu nyegara gọvanọ, bụ ‘Sir’Willie Nwokoye, kọwara na mmemme Isita nke afọ a ga-ewetara ndị Anambra nile ntọhapụ, mmepe ụzọ nakwa mbuli elu n’ụzọ dị iche iche, ọbụnadị site n’ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ.

Na mbụ n’okwu ya, onye Bishọpụ enyemaka ụka katọliki na Dayọsịsị Onịtsha, bụ ‘Most Reverend’ Dennis Isizọ chetaara ndị ụka na ọ bụ site n’ụzọ nke obe ka mmadụ pụrụ isi wee ruo n’obe, ma kpọkuo ha ka onye ọbụla nọgide n’ụzọ nke Christ, iji wee keta oke n’uru dị n’ahụhụ ọ hụrụ n’elu obe, na mmeri o meriri nsogbu nile nke ụwa.

N’aka nke ya, Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka itinyesi akụrụngwa n’okporo ụzọ na idozigharị ụzọ, bụ Mazị Marcel Ifejiọfọ kọwara na  mmemme Isita bụ oge dị oke mpka na ndụ onye ụka ọbụla, ma sịkwa na ọ bụ oge mmadụ kwesiri iji tụgharị uche banyere ahụhụ Christ hụrụ na ọnwụ ọ nwụrụ ya n’elu obe. Ọ kpọkuzịkwara onye ọbụla ka o were oge isita a wee mee udo n’etiti ya na ibe ya, gosipụta ihụnanya, ma kwalitekwa ọdịmma nke mmadụ ibe ya, ọ kachasị ndị e nweghị ka ọ dị ha.

Ihe pụtakarịchara ihè na ya bụ ofufe nru dị nsọ, bụ abụ dị iche iche a bụrụ site n’ọnụ ndị ọbụ abụ, tinyere ịtụ mmamma a tụrụ site n’aka ezinaụlọ dịgasị iche iche.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here