Emume ‘Chrisim Mass’ na ‘Cathedraticum,’ ome n’afọ

0
737

Chinwendu Uzoatu

 

EMUME Chrisim Mass na Cathedraticum bụ emume ome n’afọ nke ndị ụka Katolik na-eme n’ụwa nile. Emume a bụ nnukwu ọgbakọ ụmụ Chineke nke ọ bụ Bishop na-anọ n’isi ya.

Bishop na-anọ na ya gozie mmanụ dị iche iche nke ụka ji alụ ọlụ. Mmanụ a gụnyere mmanụ e ji echi echichi dịka ụkọchukwu na ndị eze, mmanụ e ji agwọ ndị ọrịa wdg.

Ndị ụkọchukwu na-anọkwa na ya kwenwoo nkwa iji chetakwa ihe ha bụ. Ọ bụkwa ohere ọma ụmụ Chineke ji atụrụ ha mma mma ma gbuoro ha ehi n’ebe ọ dị ukwuu.

Ụmụ mmadụ na-eji ihe onyinye dị iche iche nke gụnyere ego, ọgbụrị ehi, ihe oriri wdg wee gbara egwu gaa n’ihu Chineke wee tuo ya aha.

N’Awka ‘Diocese’, ndị bishọpụ gara na mpaghara ụka ha dị iche iche maka nke a. Ọ bụ n’izuụka dị asọ ka a na-eme ya. E kewapụtara mpaghara abụọ n’afọ a, Achina na Nimo ‘region’.

Ndị bishop nọ n’emume ndị a bụ bishop Awka Diocese bụ ‘Most Rev. Dr’. Paulinus Ezeokafor, ‘Bishop’ Jonas Benson Okoye na ‘Bishop’ Peter Eberechukwu Okpaleke.

Bishop na-anọkwa na emume a betọpụrụ ndị ụka ahụhụ dịịrị njọ ha dịka o si nweta ike n’aka Pope. Na mpaghara dị iche iche dịka Awka, Adazi, Ekwulobia, Akpu, Achina, Nimo, ndị mmadụ nuputara n’igwe karia ka aturu anya. N’Awka bụ isi obodo diocese, a hụrụ ọtụtụ ndị mmadụ ma ndị si n’ụlọ akwụkwọ dị elụ ebe a na-echi ndị ụkọchukwu.

A biazie na ‘region’ abụọ e kewapụtara ọhụrụ, ụmụ mmadụ nuputara n’igwe n’obi ańụri wee soro chụọ aja ‘mass’ mbụ na mbụ ya. Nke a were bụrụ ihe nnukwu oke ọńụ.

Ụzọ agaghị ụbọchị ahụ n’Achina na Nimo n’ihi na ọ bụ agha a kara aka nke a naghị eri ngwọrọ.

Bishop Peter Eberechukwu Okpalaeke na-enye Ngozi n’emume  ‘Chrism Mass’ na ‘Cathedraticum’ Adazi ‘Region’.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here