Emume ụka nne

0
1353
PIC. 5. MEMBERS OF CATHOLIC WOMEN ORGANISATION (CWO) OF ST LUKE CHAPLAINCY, UNIVERSITY OF ABUJA TEACHING HOSPITAL, GWAGWALADA, CELEBRATING MOTHER'S DAY IN ABUJA ON SUNDAY (30/3/14). 1976/30/3/2014/CH/AIN/NAN

Chinwendu Uzoatu

 

Ọ BỤ onye na-aza mama? Nne! Mama m ihe dị mma ka m ga-emere gị – Ayamma Ayamma, onye ọ ga-adịrị mma – Ayamma.

Nke a bụ egwụ na-adị ewụ na ọkụkọ n’ọnụ ma a na-eme emume ụka nne. Ụka nne bụ oge ndị ụka jị aka ụka wee kelee Chineke maka ọnyinye nke ndị nne.

Ajụjụ wee bụrụ, onye bụ nne? Kedụ ọnye a na-akpo nne? Nne bụ nwanyị Chineke kere wee tinye ya n’ezinaụlọ ka ọ bụrụ ọnye nchịkọta, onye mkpokọta, onye ụdọ, onye a na-elegara anya na ọ bụ ya ga-eweta ihe ebe ihe adịghị. ọnye nne bụ nwanyi maara ihe ekwe na-akụ ma n’uju ma n’ụkọ. Ọ bụ nwanyị maara anya e lere ele na nke a rọrọ arọ. Ọ bụghi onye ọKE Ọwu.

Nne bụ nne nyere onye ọbụna no n’ezinaụlọ ya.

A bịa n’ezinaụlọ ọbụna, e nwere nwoke bụ ịsị, ọ bụ ya lụbatara nwanyi nke a na-akpo nne. ọ bụ oke na ọlụ dịrị onye nne ịhụ na dị ya na-enwe ọbi anụrị. Nne na-eme nke a site n’ịsiri di ya ezigbo nrị. Ọ gaghi ekwe ka agụụ gụọ dị ya, n’ihi na agụụ so n’ihe na-eme ka nwoke gbawa n’iro. Ọ ga-ahụ na di ya na-adị ọcha ma na-enyekwara ya aka n’ọlụ. Ọ ga na-adụ dị ya ọdụ ga na-abara ya ụrụ. N’ikwụ nke bụ eziokwu, ọlụ ndị nne karịrị akarị n’ebe di ha nọ, ọ bụ agụkata agba awaa.

Mana ọbụ gịnị na-emezi n’oge a ? Ụfọdụ na-egbuzi dị ha, ụfọdụ na-alụsọ dị ha ọgụ. ịhe ndị a jọrọ njọ n’ihi na ọ bụghi ejiri mara onye nne.

Ọ bụkwa ọke na ọlụ dịịrị onye nne ilekọta ụmụ ya, site n’isiri ha nrị, ịsụrụ ha akwa, ịhụ na ha nwere ahụ ike mgbe ọbụna. Ọ ga na-elerụ ha anya makana ọ bụ ụmụaka a na-akpọ ya nne. Iwụ dịịri ya ịlụ ọlụ ya n’ebe ụmụ ya nọ n’ihi na ọ bụ maka nke a ka Chukwu jiri nye ya ha. Mgbe ha tokwaara, ha ga-akwụghachi ya ụgwọ ya mmaji kwụrụ mmajị.

A bia n’ala Igbo, a na-ebi ezinaulo ụbara mkpuke nke gunyere ma ndị oknye dịka nne na nna mụtara dibụlọ. Ya mere nwanyị ọbụna bụ onye nne, ọ dịịrị ya ilekota nne na nna di ya. Ọ ga-eme nke a ka ngọzị ya wee zụọ ọke n’aka Chineke. Mana ọtụtụ ndị nne na-eleghara ma di ha, ụmụ ha tinyere nne na nna di ha anya. Ha amaghi na ọ bụ iko i ji manyere mmadụ ka a ga-ejị manyere gị. Makana ọmụ nkwụ na-achi igbegiri ọchị, ịgbegiri wee sị ya na ya dị otu ahụ ọ dị na mbụ, mana n’oge adịghị anya na ya bụ ọmụ nkwụ ga-adịkwa ka ya. Nke a pụtara na onye nne ọbụna ga-emechaa bụrụ nne dịi, ghọọ agadi nwanyị.

Ya mere ọ bụ ọlụ onye nne ịlekọta ma onye ụkwụ ma onye nta nọ n’ezinaulo, tinyere odịbọ ma ohu.

N’ime ihe nịle, onye nne ga-abụrIrị onye ekpere.ọ bụ site n’ekpere ka ọ ga-ejị nweta amara n’ aka Chineke ịjị lụọ ọlụ ya nke ọma. Ka ọ dị ụgbụa, ndị ụka na-eme emụme Uka nne. Na nwa mgbe gara aga ka ndị Anglikan mere nke ha; ụka na-abịa abịa ka ndị katolik ga-eme emụme a. Ndi nne na-emere ụmụ ha ụka nne site n’izụkọta ihe sie nri dị ụtọ ha na ezinaụlọ ha erie mịchaa ọnụ.

Mgbe nne mere ọkenye, ọ bụ ọke na ọlụ dịịrị ụmụ ya izụkọta ihe ọrịrị, ịhe ońụnụ, akwa, ola nti na nke aka, tinyere ihe akụ na ịhe enwe enwe wee meere nne ha ụka nne makana nne bụ ihe ukwu.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here