Ndị Fụlani awakpokwala Enugu ọzọ, gbuo otu onye nche

0
637

Izunna Okafor dere akụkọ ndị a

 

DỊKA nke ha mere na mgbe gara aga ji nwayọ na-ajụ oyi, ndị Fụlani na-achị ehi awakpokwala obodo Ọkpankụ, dị n’okpuru ọchịchị Anịnri nke steeti Enugu ọzọ, ma were mma gbukasịa otu onye nche.

Ya bụ mkpamkpa bụ nke were ọnọdụ ụbọchị Monde gara aga ma bụrụkwa nke wetara ọtụtụ mmerụ ahụ nyere nwa amadi ahụ, dịka ha weere mma bọọ ya ka anụ ehi.

Dịka onye ọnọ mgbe o mere siri wee kọọ, ndị Fụlani ahụ chịịrị ehi ha na-aga iro ogologo n’obodo ahụ, wee ruo mgbe ha wụbàtara n’otu ezinaụlọ otu ọkaiwu Eric Ogbudu, wee malite ịghọ mkpụrụ osisi dị ebe ahụ, ka a ga-asị na ọ bụ nke nna ha kụrụ. Nke a mezịrị onye ọlụ nche nọ n’ụlọ ahụ jiri pụta wee chọọ ka o gbochie ha; ha wee nụso ya ọgụ, ma were mma gburikọọ ya.

Ka nwa amadi ahụ malitezịrị iti mkpu ka a gbatara ya ọsọ enyemaka, ndị Fụlani ahụ bihapụrụ ya, rie mbọmbọ, ma tinye isi n’ọhịa, zofuo, dịka ha maara na ndị mmadụ ga-agbara bịaba ebe ahụ iji mara ihe na-eme.

Otu ọ dị ugbu a, ya bụ nwa amadi a wakporo ụlọ ya, bụ Ọkaiwu Eric Ogbudu agaala nye mkpesa n’isi ụlọ ndị uwe ojii dị n’Ọkpankụ, ebe ụfọdụ ndị ụwe ojii bụzịkwa ndị e zigaworo n’obodo ahụ ka ha ga mee ka iwe ndị ntorobịa bi n’obodo ahụ kutuo, bụkwa ndị kpebigoro na ha ga-achọpụtarịrị ebe ndị arụrụ ala ahụ nọ, ma gwọọ ha ji mmanụ.

N’okwu ya banyere nke ahụ, onye okwupụta ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Mazị Ebere Amaraizu kọwara na mwakpo ahụ bụ eziokwu, ma sịkwa na ndị ọlụ ha amalitego ime nnyocha banyere ya bụ ajọ ọnọdụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here