Otu egwuregwu si eweta udo n’obodo

0
787
Ịlụ nwanyị na ala Igbo

EGWURUEGWU bụ ihe na-enye obi ụto. Egwuruegwu bụ ihe na-eme ka mmadụ chịa ochị. Egwuruegwu na-eme ka udo na ezi mmekọrịta dị na etiti enyi na enyi nakwa obodo na obodo. Egwuruegwu na-eme ka akwala ahụ mmadụ sie ike ma na-alụ ọlụ nke ọma.

 

N’oge ochie, ọdị ụdị egwuruegwu ole na ole dị mgbe ahụ dịka ịgba mgba, ịgba egwu, egwu ọnwa, akụkọ ifo na iti mmanwụ. Oge ochie, obodo ọbụna nwere ụdị egwuregwu na-ewu ewu na mpaghara nke ha. Ịgba mgba bụkwa otu mmemme na-ejikọkari obodo n’ibe ya.N’oge ahụ, obodo ọbụla nwere mmemme ịgba mgba, ndị gburugbu ha nile na-abịa. Ụfọdụ na-abia isonye na asọmpi mgba ahụ.

Ụfodu na-abịa ka ha legharịa anya ma nwee ọńụ. Ọ bụrụ na o nwere  onye obodo ọzọ ga-eso gba mgba ahụ, ndị mpaghara obodo  ahụ na ndị ikwu na ibe nke onye ahụ ga-eso gba mgba ahụ ga-abia ịkwado onye nke ha, maka n’udo dị na etiti obodo abụo ahụ. Ndị obodo nke ọzọ ga-abia n’igwe na-enweghị egwu ma a ga-alụ ọgụ ma ọ bụ gbue mmadụ.

Ihe ọzọ na-eweta udo na etiti obodo na ibe ya bụ ịgba egwu. Ọ bụrụ n’obodo na-achịkọba egwu ha ga-agba, mgbe ha mụzuru egwu ahụ, ha na ezigara obodo ndị dị ha nso ozi na ha ga-ebupụta egwu n’ihi n’udo na ezi mmekọrịta dị n’etiti obodo abụọ  ahụ.Ndị enyi na umu nne ha bi n’obodo ha kpọgasịrị ga-abịakwa n’igwe ịkwado ha na egwu ha na ebupụta.

Ọzọkwa, egwu ọnwa n’oge ochie sokwa na eweta udo n’etiti obodo na obodo.N’oge ahụ,ụmụ okorobịa na-aga obodo dị ha nso ma onwa na-eti, ha gwusie egwu ọnwa, ha alọtakwa obodo nke ha n’abali ahụ n’ ihi na udo dị na etiti ha.

N’oge ugbu a, egwuegwu ka na agakwa n’iru na-eweta udo n’etiti obodo na obodo na mba na mba.E nwezịkwara ọtụtụ egwuregwu ugbu a karịa ka ọ dị na mbụS. Ụfọdụ egwuregwu e nwere ugbu a bụ ndị a, egwuregwu bọlụ, egwuegwu table tennis, egwuruegwu basket ball, Igwu mmiri, iwu jump, ‘lawn tennis’, ‘short put’,nakwa ọtụtụ ndị ọzọ a gaghị e depụta nwu ebe a. Egwuregwu ndị a nile na-eme ka e nwee udo na ezi mmekọrịta n’obodo na obodo nakwa mba na mba. Ọtụtụ mmadụ ejirila otu n’ime egwuruegwu ndị a gaa ala bekee ma ọ bụ mba Africa ndị ọzọ  ma sikwa otu ahụ nweta enyi.

Mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ n’obodo na obodo enwee nsogbu, mgbe ọbụla ha malitere chọba udo, ihe izizi e ji amalite ịcho ya bụ udo bu I tinye otu egwuruegwu nke na abụkarị ịgba bOlụ. Nke a na abụkarị na etiti ụmụ nwoke, maka na ọ bụ ụmụ nwoke ka ọgbọaghara obodo na-adakaị n’isi ma site n’ịgba bọlụ ahụ ha a malite hụtaba onwe ha  dịka enyi na enyi. Site na ụzọ  dị otu a,  udo na ezi mmekọrịta e were ọnọdụ n’ obodo abụọ ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here