‘Ọtụtụ ndị ntorobịa gà-erita uru n’amụma nkwado Gọvanọ Obianọ’

0
577
Asusu Igbo

DỊKA otu n’ime ụzọ isi mezupụta nkwa o kwere banyere ihe ọ ga-eme n’ọchịchị ya nke abụọ, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ amalitela amụmà nkwado na inye nkụzi pụrụ iche maka ndị ntorobịa, ma bụrụkwa nke a malitere na Nnewi n’isi ngwụcha izu ụka gara aga.

 

Ya bụ amụmà nkwado na nkụzi bụ nke a chịkọbara site n’aka onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ n’ihe gbasaara ịmụ ọlụ aka ndị ntorobia n’oge gara aga, bụ Mazị Eloka Mmadụekwe, sịte na njikọ aka nke ụlọ ọlụ ‘Reality Forum’, bụ otu ụlọ nnọrọ onwe a ma ama n’ime ntụnye pụrụ iche na mpaghara Nnewi na obodo ndị ọzọ gbara ya gburu gburu nakwa ịkwalite ezi ọchịchị nke otu ndọrọ ndọrọ APGA na steeti ahụ.

Ya bụ Ọgbakọ, nke isi okwu ya bụ: “Ọmụmụ Ọlụ Aka: Ụzọ Kacha Mma Isi Weta Otútó Nke Ọnọdụ Akụnụba”, dọtara imirikiti ndị mmadụ dị iche iche, bụ ndị megoro nke ọma dịka ndị ọlụ aka, nakwa ndị na-ewunye ihe mwunye dị iche iche sitere Nnewi, ma bụrụkwa ndị megoro ihe na-ada ụda na nkwalite nke ọnọdụ akụnụba steeti Anambra na ọnụ ego ala Nigeria.

Ụfọdụ ndị ntorobịa sonyere n’ihe nkuzi ahụ

Ọtụtụ n’ime ndị a gụnyere Mazị Ajụlụ Ụzọdike, bụ onye chọpụtara ụlọ ọlụ ”Cutix Plc.”; Dọkịnta Dozie Ikedife, bụ onye ọlụ ahụike na onye nwe ụlọ ọgwụ ”Ikedife Specialist Hospital, Nnewi”; Mazị Linus Ilozue, bụ onye isi na ọga kpata kpata nke ụlọ ọlụ “Chicason Group of Companies, Nnewi”; Mazị Humphrey Ngọnadị, bụ onyeisi ụlọ ọlụ “Ngonadi Group of Companies”, tinyere Mazị Pedee Ọfọdeme, bụ onyeisi ụlọ ọlụ “Poncad Integrated Services”. Ndị a nile bụkwa ndị a kpachapụrụ anya wee họrọ ka ha wee were ọgụgụ isi na amamihe ha wee metụta ndụ ndị ntorobịa ahụ, bụ ndị chọrọ ịmụ ọlụ aka dị iche iche, nakwa ịmụta otu ha ga-esi chekwaba, kwalite ma hazie obere ụlọ ọlụ ha nwere, ka o wee guzoro n’ogogo dị elu.

GUO:  Obiano ebunyela ndị eze niile n’Anambra ụgbọala

N’okwu mmalite ya na ya bụ ọgbakọ, onye nhazi atụmatụ ahụ, bụ Mazị Madụekwe kọwara na ọ bụ mmasị ọchịchị nọ ugbu a na steeti Anambra na atụmatụ nkwado ndị ntorobịa Nnewi ahụ ga-enwetazu na ebumnobi nile nke e kworo chịkọba ya, ma kọwaa na dịka oge na-aga, na a ga-ebukwa ya bụ atụmatụ gazuchaa n’okpuru ọchịchị iri abụọ na otu e nwere na steeti ahụ.

A ga-echeta na ọ bụ ihe mere eme na mgbe ọ na-achụ nta nkwado ya nke ugboro abụọ, bụ nke o mechaara wee nweta mmeri dara ụda n’okpuru ọchịchị nile e nwere na steeti Anambra, na Gọvanọ Obianọ kwere nkwa ịtụpụta na ịbagide n’atụmatụ dị iche iche iji kwalite ọnọdụ na ọdịmma ndị ntorobịa na steeti ahụ.

N’okwu nke ya, onye chọpụtara ma bụrụkwa onyeisi ụlọ ọlụ Reality Forum, bụ Mazị Ụzọ Nwosu mere ka ndị ntorobịa ahụ mara na ọ bụrụ na ha mụchaa ọlụ ọbụla ha chọrọ ịmụ, na a ga-enye onye ọbụla n’ime ha ego mgbazinye ga-ezuru ya ịmalite nke ya, bụkwa ego mgbazinye nke ọmụrụnwa ọbụla adịghị n’elu ya.

Mazị Nwosu, bụ onye chọrọ iji aha otu ndọrọ ndọrọ APGA wee zọọ ọkwa onye nnọchi anya ọgbọ nta nkwado Nnewi North/South/Ekwusigo n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu etiti, mere ka a mara na ebumnobi nke inye nkụzi ọmụmụ na nkwado ọlụ aka ahụ bụ iji mee ka ndị ntorobịa nwee ọlụ aka nke onwe ha, kwụụrụ onwe ha, ma sokwa na-atụnye ụtụ nke ha na nkwalite nke otútó na ọnọdụ akụnụba nke ala anyị. Ọ kọwakwara na nke ahụ ga-enye aka n’ibelata mpụ na arụrụ ala, tinyekwuoro na ọ ga-enyekwa aka n’ikewapụta ọtụtụ ohere ọrlụ n’ala anyị.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here