Uru na ọghọm udu mmiri na-eweta

0
1227
udu mmiri
udu mmiri

Chinwendu Mba dere akụkọ ndị a

 

UDU mmiri bụ oge mara mma n’ihi na Chineke hụrụ ihe o kere bụ mmadụ n’anya wee hazie oge ọ bụla  na mgbe ya. Udu mmiri bụ oge ihe nile a kụrụ n’ubi ji eto ma na-emekwa nke ọma. N’ezie  oge mmiri na-amalite, ahịhịa nile na-enweta ndụ ọhụrụ, ma mmadụ ma osisi dị n’ọhịa na-ańụrị ọńụ n’ihi mmiri ma o bidosie. N’oge mmiri ozuzo, osisi na ahihia nile na amalite rube akwụkwọ ọhụrụ.

Ala n’onwe ya na enwetakwa ndụ n’ihi na ọ na-adịkwa nro maka ịkọ ihe na ị kụnye mkpụrụ dị iche iche. N’oge mmiri ozuzo, ebe nile n’ajụ oyi. Mmadu nile na-alahụ ụla nke ọma. Ọ dị ọtụtụ uru a na-enweta n’oge udu mmiri .Na mbụ, ọ bụ oge e ji akọnye ihe n’ala dịka ji, akpụ, ọka, nduku, jioko, unelle, ọkanwajata, ose, ọkọrọ na akwụkwọ nri dị iche iche. Ọ dịkwa ọtụtụ ihe ọzọ a na-akọ n’oge udu mmiri ohere agaghị ekwe ka e depụta na ebe a.

Oge mmiri ozụzo bụ oge e ji enwe ụbara ihe oriri n’ala ọ bụla. Malite na ọnwa isii nke afọ ọ bụla, ọka na-ejụpụta ahia nile ma ube eji ata ya na kwa akioyibo. A na-enwe ubara mkpụrụ osisi n’oge udu mmiri dịka cucumba, watermelon, egusi nakwa ndị ọzọ. Jioko na ejụpụtakwa ahia nile.N’ezie, oge udu mmiri, nne na nna na ekurutu ume n’ego ha na-emefu maka na  ihe oriri na-adị n’oge ahụ.

N’ezie, ihe ọ bụla nwere uru nwekwara ọghọm dị na ya. Ọ bụ otu ahụ ka ụwa si aga. Oge udu mmiri bụ oge ahia ji etoju ebe nile. Agwọ na akpi e ju  ebe nile. Oge  udu mmiri bụkwa oge ụfọdụ ezinaụlọ ji aba na nsọgbụ .Otu aka ahụ, obodo ndị mbize n’akpa ike na be ha na-enwekwa nsogbu n’oge udu mmiri. Ụfọdụ ezinaụlọ na-etụfụ ọtụtụ ihe dịka ụlọ ma ọbụ mmadụ na oke ide mmiri.Ụfọdụ n’etufu ngwa ahịa ha ma ọ bụ ego na ide mmiri. Oge ụfọdụ, mbize eburu osisi, nkwụ nakwa ala ha. Ọ dịkwa ọdachị ọzọ na-adị n’oge udu mmiri dịka ọria, oke oyi, ihe na-ata n’ọkpụkpụ, ụkwara na ụdị ọria ndị ọzọ dị iche iche.

Ọghọm ọzọ nye ndị ọlụ ụgbọ n’azụ ụmụ anụmanụ n’oge udu mmiri bụ na anụmanụ ha n’anwụ n’oge ahụ n’ihi oyi. Ọghọm ọzọ bụ na ndị nwere ubi na ofe mmiri adighi aga ubi ma mmiri too. Ọ bụ nanị ndị nwere ụgbọ epepe na-aga ubi ha ma mmiri o toro ma ọ bụ na o toghị. Ọ dị otu akwụkwọ Igbo ndị prịmarị gụrụ n’oge gara aga maka udu mmiri na ọkọchị e sere ọkọchị ọ taa ahụ n’ihi na ebe nile kpọrọ nkụ ma see udu mmiri o bụọ ibụ n’ihi na ọ na-eriju afọ. Ndị na-alụ ọlụ ụzọ na- enwekwa ọghọm. Oge ụfọdụ, ha lụsia ọlụ na ụbọchị laa, abali, mmiri ezoo buru ihe nile ha lụrụ, ego nile na ngwa ọlụ nile ha ji lụọ ọlụ a laa n’iyi.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here