Chudie ebiputala akwụkwọ ọhụrụ n’Akwa

0
498

Izunna Okafor

 

Ọ BỤ nnọọ oge nkwupuru, mwulite mmụọ na agbamume, dịka nwaafọ steeti Anambra na-ewu ewu n’edemede akwụkwọ, bụ Oriakụ Chudie Juliet kpughepuru akwụkwọ ọhụụ ya, bụ nke ọ kpọrọ “The Mother’s Heart Bleeds.”

 

Mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ ezumezu nke ọba akwụkwọ Kenneth Dike dị n’Awka, ma bụrụ nke dọtara igwe mmadụ sitere na mpaghara ebe dị iche iche n’ala Nigeria.

 

N’okwu ya ka ọ wachara ọjị na mmemme ahụ, onye nọ dịka nna na mmemme ahụ, bụ Chiifu Emmanuel Chibuko (Ọnwa n’Ụmụmba) kọwara mmemme ahụ dịka ịhe kwesiri ekwesị nakwa nke bịara n’oge ya, n’ihi na ihe dị mma na anya gbara akwụkwọ. O toro onye ahụ dere ya bụ akwụkwọ maka ezi amatụ ahụ, ma tokwa ọhaneze ndị bịara mmemme ahụ maka ịza ọkpụkpọ oku ahụ dị oke mkpa.

 

Na ntụnye nke ya, onye nọgodi dịka onyeisi ọba akwụkwọ Kenneth Dike, bụ Nwada Nkechi Udenze kọwara akwụkwọ dịka ihe dị oke mkpa na ndụ mmadụ ọbụla, kọwaa ide akwụkwọ dịka ihe kwesiri nkwàdo, ma tokwazie Nwada Juliet maka itinye ezi ọnatarachi o nwere n’ihe bara uru, bụzị nke mere ka ide, ibipụta na ibuputa akwụkwọ ahụ bụrụ nrọ pụtara ihè. Ọ kpọkukwara ọhaneze ndị bịara mmemme ahụ, ọ kachasị ụmụakwụkwọ, ka ha jisie oke n’ịgụ akwụkwọ ma werekwa ya mere akụkụ obibi ndụ ha, n’ihi na onye na-agụsi akwụkwọ ike nwere ihe dị iche iche o jiri karị ndị ọgbọ ya, ma n’ụlọ alwụkwọ, n’ide akwụkwọ, nakwa n’obodo.

 

Na mbụ n’okwu mmalite ya, onye ahụ dere akwụkwọ, bụ Nwada Chidie Juliet toro aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka inwe mmasị pụrụ iche n’ebe ndị ntorobịa nọ, site n’ịtọ ezi ntọala na ime ka gburu gburu dị larịị maka utó na ọdịmma nke ụmụ ntorobịa na steeti ahụ. Ka ọ na-akọwa ihe gbasaara akwụkwọ ahụ o bipụtara, o mere ka a mara na akwụkwọ ahụ bụ ọkpụkpọ oku pụrụ iche nyere ụmụnwanyị iji mee ka ha mara na onye ọbụla n’ime ha nwere ihe pụrụ iche chi ya tinyere n’ime ya, bụ nke ọ dụrụ ha ka ha ghara iji maka ịdabere na mmadụ wee kwe ka ọ nwụọ ma ọ bụ ghọ ahịa, wee mezie ka onye ahụ bụrụ mmadụ efu na onye tụfugoro okpu eze ya. Ọ kọwara akwụkwọ ya dịka nnukwu ọgwụ pụrụ iche nyere ya, ma bụrụkwa nke mere ka o were ụwa etu o siri hụ ya ma gaa n’ihu, dịka ọ kọpụtara etu ndị enyi ya siri gbakụta ya azụ ma hapụ nanị ya n’ime akwa arịrị oge di ya nwụrụ wee hapụ ya na ụmụ ha abụọ, mgbe nke obere dị naanị otu ọnwa.

 

 

N’okwu nke ya oge ndị nta akụkọ na-agba ya ajụjụ ọnụ, Oriakụ Juliet Ngene, bụ nne onye ahụ dere akwụkwọ, kọwara nwa ya nwanyị dịka ugwu o nwere, too ya maka ime ka ihu ọchị wa ya, ma gọkwazie ọfọ ka akaraka ya wetere ya mmepe ụzọ na mbuli elu, dịka ọ na-achụso ọnatarachi ya na ndụ a.

 

Na ntụnye ya, otu onye  soro wee gbaa ọnya ego na ya bụ mmemme, bụ onyeozi Amaka Akaigwe (bụ onyeisi ‘Apostle Amaka Care Foundation’) kwuputara na nwada Chudie jiri nnọọ ogoogo dị elu wee malite, ma sịkwa na o kwesiri ka e nye ya nkwàdo zuru oke iji wee gaa n’ihu n’ihe ọ na-eme, dịka o gosipụtagoro na ọ bụ ọkaibe n’ebe mkpịsị odee dị.

 

Ihe ndị pụtakarịchara ihè na mmemme ahụ gụnyere ịgụpụta abụ site n’ọnụ ndị ọzọ na-ede akwụkwọ nọkwa na mmemme ahụ, ịwa achịcha e mere maka ya bụ mmemme, ikpughepu akwụkwọ ọhụụ ahụ (bụ nke e mere site n’aka eze nwanyị Igboezu Ọlụchukwu) na ịgbazị ọnya ego maka akwụkwọ ahụ kpọmkwem.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here