Ekwenti: Uru na ọghọm ya

0
1586

Chinwendu Uzoatu

 

EKWENTỊ nke mkpanaka bụ nnọọ nke bara nnukwu uru ma na-eme ka izirikọta ozi na-aga nke ọma. Kamgbe e webatara ya n’ala anyi bụ Nigeria, o belatara nsogbu a na-enweta n’ihe gbasara ịgbasa ozi.

 

Ka ọ dị ugbua, mmadụ na onye nọ mba ofesi na-akpazi nkata oge ọ bụna ha jiri chọọ. Ọ bụzighi nke e dee leta ,ọ nọọ n’ụzọ ihe kariri otu ọnwa Mgbe ụfọdụ, leta ahụ na-efukwa n’ụzọ. Ugbua, akụkọ ahụ abụrụla akụkọ mgbe ochie. Ekwenti mkpanaka e meela ihe gbasara igbasa ozi ka ọ dị mfe.

 

N’oge mbụ, ọ bụrụ na mmadụ a nwụọ, a na-ezipu otu onye obodo ya ka ọ gaa kpọọ nwa onye ahụ nọ n’obodo mepere emepe. Mgbe ụfọdụ, tupu nwa onye ahụ nwụrụ anwụ a lọtararuo, ọ bụrụ na e liela onye ahụ. Mana ka ọ dị ugbua, tupu mmadụ a nwụọ,a na-akpọ onye ọ bụna o metutara n’ekwenti nke bụ na onye ahụ ga-alọta, nọrọ wee hụrụ nke na-eme.Uru ekwenti a bara bụ agụkata agba awaa. Ọ bụ ekwenti ka a ga-eji zisaa ozi ka ọha na eze wee mata maka ya bụ ihe.

Onye na-apị ekwentị n’ụgbọ ala

Ya mere, uru dị n’ekwenti kariri akari mana ụfọdụ ndị mmadụ jizi ya wee na-emezi iberibe. Ụfọdụ mmadụ na-anọ n’ụlọụka na-apị ekwenti. Nke a jọgburu onwe ya makana ihe nile nwere oge.Nke a bụ arụ ma bụrụkwa ịkpasu Chineke iwe. Onye ọ bụna na-abata n’ụlọụka kwesiri ịgbanyụ ekwenti ya agbanyụ.

 

Ụfọdụ na-eme ha na-aga n’ụzọ, ha akwụchie ntị ebe ha na-ege otu ihe ma ọ bụ nke ọzọ n’ekwenti. Ihe dị otu a ebutela ihe mberede na ọnwụ mmadụ ọtụtụ oge. O kwesiri ka mmadụ na-ege ekwenti n’okporo ụzọ?

GUO:  Otu nwaanyị eleela nwa izu ụka isii, zụta ekwentị

 

Ndị ohi na-ejikwa ekwenti akpa ike ọjọọ. Ha na-eji ya wee kpaa arụ dị iche iche.Nke a wee bụrụ ihe ọjọọ nke na-ekwesighi ekwesi makana e mebere ekwenti maka ọdị mma nke mmadụ.

 

Ụfọdụ ndị mmadụ na-abụ ha kwunye ya n’ọkụ, ha a na-azakwa ya ma ọ bụ tụkwasa ya na’ahụ. Nke na-eme oge ụfọdụ ka ekwenti ahụ bigboo ma gbuo onye ahụ.

 

A na-adụzi ndị mmadụ ọdụ ka ha kpachara anya etu ha si eji ekwenti ha. Ọtụtụ ndị mmadụ atụfuola ndụ ha site n’ekwenti ibigbo mgbe ha nọ n’ọdụ mmanụ petrol na nke gas. Onye ọ bụla kwesiri ima mgbe o ji etinye ekwenti ya n’ọlụ.

 

Oge ọzọ jọrọ njọ mmadụ ịgbanye ekwenti bụ mgbe mmadụ nọ n’akụkụ igwe na-enye ọkụ. Nke a na-ebutekwa ekwenti ibigbo ma merụọ ndị nọ nso ahụ.

Ọtụtụ mmadụ atụfuona ndụ ha n’ụzọ dị otu a. O nwere nti ya nụrụ makana ọhụrụ n’anya agaghi ala.

 

A na-akpọkuzi ọha na eze ka onye ọ bụna mara oge na ihe o kwesiri iji ekwenti eme. Ọ bụrụ na mmadụ were ekwenti mee ihe n’usoro kwesiri ekwesị, ọ ga-abara onye ọ bụna uru karichaa, n’ihi na ebumnuche eji wee mepụta ya bụ maka ọdị mma nke mmadụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here