Ide mmiri agbagbuola otu nwatakịrị n’Onịtsha

0
470

Izunna Okafor

 

 

N’IHI nnukwu mmiri ozuzo malitegoro ịkwọsịsị n’ebe dị iche iche ugbu a, oke ide mmiri àgbàgbuola otu nwatakịrị gbara naanị afọ asatọ n’Ọnịtsha ma tụpụta ozu ya n’elu ala ka ụwa wee kirie.Oke ihe mwute a bụ nke weere ọnọdụ n’isi ngwụcha izu ụka gara aga, ebe ozu nwatakịrị a aka ya dị ọcha bụzị nke a hụrụ na mpaghara ụzọ ahịa ochie, dị n’akụkụ nkwụsị ụzọ Egerton.

 

Dịka ndị bi na mpaghara ebe ahụ siri kọọ, nwatakịrị ahụ, onye aha ya bụ Ọlụebube Nwanedo, bụkwa nwata akwụkwọ nọ n’ogo praịma nke anọ ya n’ụlọ akwụkwọ “Holy Child Primary School Onitsha” ma bụrụkwa nwa mbụ nke Mazị na Oriakụ Nwanedo, bụ ndị sitere n’Obodo Ụmụezike nke dị n’okpuru ọchịchị Ọrlụ na steeti Imo.

 

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, nne nwata ahụ, bụ odozi akụ Amaka Nwanedo, bụ onye anya mmiri na akwa arịrị ekweghị kwuo okwu nke ọma, kọwara na nwa ya nwanyị si ebe ha gara ọmụmụ ihe n’ụlọ ụka wee na-abata, ka oke mmiri ozuzo ahụ zochaara, ide mmiri wee buru akpụkpụ ụkwụ ya, ma burukwazie ya onwe ya ozigbo, dịka ọ na-achọ ka o ga-esi weta ya bụ akpụkpụ ụkwụ.

 

O mere ka a mara na mbọ nile a gbara iji wee zọpụta nwata ahụ bụ nke amịtaghị mkpụrụ ọbụla, wee rukwaa oge a hụzịrị ozu ya ebe ọ tọgbọrọ n’ụtụtụ echi ya.

Ozu nwata ahụ bụkwazị nke e burugoro laa n’obodo be nna ya, ebe a nọrọ wee kwaa ya.

GUO:  Ịgbochị mkpamkpa ide mmiri n'ala anyị

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here