Igba egwu

0
1150

Uchenwa Mba

 

IGBA egwu bụ otu ihe jikọrọ mba ụwa nile ọnụ dịka asụsụ siri jiko mmadụ ọnụ.Na mmalite ụwa na mgbe ochie,asụsụ ụwa gbara otu. Mgbe ha gabara otu Chukwu achọghị, Chukwu wee ghasa asụsụ ha. N’ihi na Chukwu hapụrụ mmadụ uche, ha chepụtakwa ihe ọzọ ga ejikọ ụwa ọnụ nke bụ igba egwu.

 

Igbe egwu bụ ihe mba nile na-eme ma bụrụ ihe ọ ga abụ ilebe ka a na-agba ya, obi ụtọ amalite kpaba gị ma ịnụrụ asụsụ ha ji agụ ya ma ị nụghị.Ọ bụ ihe na-eme ka mmadụ chezọ mkpasu iwe ọ bụla.

 

N’ ụbọchị Satodee bụ ‘April’ 29, a ga enwe ụbọchị ndị ‘International Theatre Institute’ wepụtara ka ọ bụrụ ụbọchị igba egwu na mba ụwa nile ga na emerube. Egwu bụkwa ihe mba ụwa nile ji emerube mmemme ha iji mee onwe ha obi ụtọ. Mba ụwa nile hụtara egwu dịka otu ihe na-amasi onye ọ bụla. Ọ bụ ya mere ‘International Theatre Institute’ jiri wepụta ‘April’ 29 afọ ọ bụla ka ọ bụrụ ụbọchị igba egwu.

 

Egwu dị na ụdi na ụdi. E nwere egwu omenala, enwere egwu ọdinala dịka nke ndị Ohafia. Enwere egwu ụmụ agbọghọ, enwere egwu ụmụ okorobia, e nwere egwu ndị nna, enwere egwu ndị nne nwanyị. Egwu omenala bụ egwu nke ọ bụ nani ndị chiri echichi ka ana akụrụ egwu ahụ.Onye ọ bụla echighi echichi adighị agba ya. Egwu ụmụ okorobia bụ nani ụmụ okorobia n’agba ya, nke ụmụ agbọghọ bụkwa nke nani ụmụagbọghọ na-agba . Egwu ndị nne nwanyị bụkwa nani ndị ahụ nwere ndị n’agba ya, egwu odinala bụkwa nke mmadụ nile dị na obodo ahụ nwere ike igba  na enweghị iwu ha ga-ada.

 

Enwere egwu ụka.Ihe dị iche na egwu ndị a nile bụ na egwu ụka bụ Chukwu ka ha na agụrụ egwu ahụ. Egwu ndịa nile nwere mmemme eji ya eme Ị gaa ebe dịka Onitsha, ị ga-ahụ ụmụ ikorobia ka ha na etiri egwu, ọkachasị ebe a na-kwa ozu ma ọ bụ ebe a na-agba ọfala. Ọ dịkwa egwu ndị ọzọ enwere dịka egwu ekpiri, akụkọ na egwu na egwu nke ndị ọcha na- agụ.

 

Ọ dị egwu eji agba nkwu, egwu eji eme igba akwụkwọ, egwu eji ekupute nwa, egwu eji eme ncheta ọmụmụ mmadụ. E nwekwara egwu ụmụ ọgbara ọfụụ mana isi ha nile bụ na egwu bụ ihe obi ụtọ nye mmadụ nile ma onye ọcha ma onye isi oji.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here