Ndị South Africa gbaala otu nwa Nigeria ọkụ na ndụ

0
538

Chinwendu Uzoatu

 

OTU dimkpa onye Nigeria ka a gbara ọkụ na ndụ na South Africa n’ebe ndị uweoji mba ahụ nọ na’ele anya n’agbaghị mbọ ọ bụna iji gbochie ọdachị a.

 

N’otu aka ahụ, ụmụ Nigeria mmadụ iri na anọ bụ ndị katọrọ ogbugbu e gburu onye otu ha na North West Province obodo ahụ n’ọnwa Febuari ka nọkwa n’ụlọ itiri.

 

Gọọmenti etiti agbarụọna ihu maka nke a ma kpọkuo ndị isi ọchịchị South Africa ka ha mara ihe e mere ka eweta oke ogbugbu a na-egbu ụmụ Nigeria nọ na mba ahụ n’isi njedebe.

 

Nwa Nigeria, Clement Nwogu, bụ onye a gbara ọkụ na ndụ site n’aka igwe mmadụ iwe na-ewe. Ozi si n’aka ndị Nigeria bi South Africa kwuru na ya bụ dimkpa ọdachi ahụ dapụtaara, onye Njikoka na steeti Anambra, bụ onye nke igwe mmadụ dakporo ma gbuo ya na Rustenburg North West Province.

 

Ode akwụkwọ ndị Nigeria bi South Africa bụ Habib Miller n’okwu ya kọwara na e gburu dimkpa a n’anya ọcha maka ụda asụsụ ya nke ndị ahụ kpara mkpamka ahụ n’anabataghị. Okwu ya ziputara na asụsụ ya kpasuru ha iwe, ha wee dakpoo onye aka ya dị ọcha, gbuo ya n’ike.

O kwuru si, “igwe mmadụ ahụ dakporo ya ka a ga-asi n

a ọ bụ onye omekome, ma burukwa ihe mmerụ ahụ dị iche iche na-akụ ya n’ihu ndị uweoji mba South Africa. Onye nọ ebe o mere kwuru na nwa amadi a tikuru ndị uweoji ahụ ka ha nyere ya aka mana nke ahụ amịtaghị mmịmị ọ bụna n’ihi na ndị uweoji ahụ gbachiri nkịtị. Mgbe Nwogu enweghịzi ike idinwu, ọ gbapụrụ ọsọ ndụ,ha jide ya, gbasa ya mmanụ ‘petrol’ ma mụnye ya ọkụ.

GUO:  Na South Africa, a tụọla onye uweojii nga maka igbu nwa Nigeria

 

O kwuru na igwe mmadụ ahụ hapụrụ ya oge ha chere na ọ nwụọla. Onye okwuputa okwu a gara n’ihu kwuo na ọ bụ oge igwe mmadụ ahụ pụrụ ka ndị na-agafe agafe nyere aka buga Nwogu ụlọgwu ‘Job Shimankane Hospital’ na Rustenburg.

 

N’ihi na ha chere na ọ ka dị ndụ, mana ọ nọzi n’ụlọgwu ahụ wee nwụọ. Miller rụtụkwara aka na mmadụ iri na anọ e tinyere n’ụlọ itiri n’ihi na ha katọrọ ogbugbu e gburu otu onye otu ha (onye Nigeria) na Febuari ka nọ n’ụlọ itiri.

 

O kwuru sị na ndị isi ndị uweoji gburu onye Nigeria ahụ n’ike na Disemba 17, 2017, oge ha enweghị ike inapụtanwu ya ego.

Miller gakwara n’ihu kwuo na ndị uweoji ahụ bụ ndị nke agbapụtarala na ‘bail’, ebe ndị katọrọ ogbugbu e gburu onye otu ha ka nọ n’ụlọ itiri.

Otu o sila dị, ọtụtụ ndị ọnụ ruru n’okwu na Nigeria akatọọna ọdachị  a ma gwa gọọmentị South Africa ka e lebaa ya bụ ọnọdụ anya, ka arụ a ha ji ụmụ Nigeria eme bịa n’isi njedebe.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here