Njem ọkada

0
601

Chinwendu Uzoatu

 

ỌGBATUMTUM, nke a na-akpọzi ọkada so n’usoro ọgbara ọhụrụ e ji emezi njem n’oge ugbua. Ọkada na-eme ka njem dị mfe ma mekwa ka onye ji ya eme njem ruo ebe ọ na-eje ọsọ ọsọ.

 

Uru dị n’ọkada karịrị akarị, ọ bụ agụkata agba awaa. Nke mbụ bụ na ọ na-eme ka onye n’enweghị ọlụ nwee ọlụ. Ọtụtụ ụmụikorobịa esitela na-ịnya ọkada wee bụrụ mmadụ. Ụfọdụ si na ya lụọ ụlọ, lụọ nwanyị ma sorokwa na ndị obodo ji biri.

 

Dịka m kwuru na mbụ, ọkada na-eme ka mmadụ jeruo ebe ọ na-eje ọsọ ọsọ. Ọ bụrụ ụzọ adịghị mma nke bụ na  ụgbọala a gaghị aganwu na ya, ọ bụ ọkada ka a na e ji wee gaa ebe ahụ n’egbughi oge ọbụna. Otu aka ahụkwa, ọ bụrụ ebe ụzọ kpọchiri akpọchi nke na ụgbọala na-akpụ akpụ ebe ahụ (‘hold up’), ọ bụ ọkada bụ ihe ga-agafere n’enweghị nsogbu ọbụna.

 

Uru ọzọ dị n’ọkada bụ na ịzụta na idozi ya adịghị oke ọnụ ka ụgbọala. Nke a mere na ọ na-enyere onye ji ya achụ nta ihe afọ ga-eri aka. Nke a mekwara ka akwụ soro ibe ya gbaa mmanụ.

 

N’agbanyeghi uru nile dị n’ọkada, o nwekwara ọghọm dị na ya makana ndị Igbo kwuru sị na ihe nwere uru, nwere ọghọm. Ndị nọ n’ọkada na-emerụkari ahụ ma e nwee ihe mberede n’ihi na o nweghị ihe kpuchitere ha. Mgbe ụfọdụ, ma onye ebu ma onye bu ya anaghị ekpu okpu ha kwesiri ikpu (‘helmet’). Nke a so n’ihe na-ebutekwa mmerụ ahụ.

 

Mmiri ozizo sokwa n’aka mgba chere ọkada. Dịka a barala n’oge udu mmiri, ị ga-achọpụta na mgbe ọ bụna mmiri bidoro zobe na ndị ọkada ga-alakpucha n’ime.N’oge ahụ, ọ bụ sọ ụgbọala ga na-aga. Nke a wee bụrụ nnukwu nsogbu nye ndị ọkada na ndị na-eme njem.

 

Mgbe ụfọdụ ka ihe e kenyere n’ọkada na-adafu n’ụzọ ma funyụọ anya. Otu nwoke si Aba nke dị n’Abia Steeti wee na-alọta obodo ya bụ Abakaliki dị n’Ebonyi Steeti. Nwoke a kenyere akpa ya n’azu ọkada ya wee zọlie njem. Mgbe ọ lọtaruru na be nna ya n’Abakaliki, o rituru ma tụgharịa ka o kepụta akpa ya nke o kenyere n’azụ ọgbatumtum ya ma ọ hụghịzị ya. Nke a riri ya ọnụ.Ndị be ha jụrụ ya ihe ọ bụ mana ọ nyeghi ya ọnụ. N’ikpe azụ, ọ zọpukwara njem chọrọ akpati akwa ahụ pụba. Mana mgbe o lere anya ya ihe dịka maịlị atọ, ọ lachighara azụ na nwute. Nke a wee bụrụ otu ihe na-adapụtaba na njem ọkada.

 

Ọzọ dịkwa ka ibe ya bụ na ọtụtụ ndị na-anya ọkada na-akpa agwa ka ndị isi adịghị mma. Ụdị ndị a na-ada iwu dị iche iche dịka ibu karia mmadụ ole ha kwesịrị ibu, ibu ibu karịrị ọkada ma nọrọ n’elu ya na-agba ka ana m anwụnyụ anya. Oke ịgba waa waa waa na-ebutekwa ọdachị n’ụzọ dị iche iche.

 

Ndị omekome na-ejizi ọkada akpa arụ dị iche iche. Ha ji ya ezu ohi site n’ịnapụ mmadụ ihe ya n’ike. Ha jikwa ya atọrọ ma ụmụaka ma okenye. Ọ bụ nke a kpatara steeti dị iche iche n’ala anyị bụ Nigeria ji machie ọkada kpam kpam, ebe ụfọdụ dịka steeti  Anambra machiri ha ịgba n’abali. Nke a wee bụrụ nnukwu nsogbu nyere  ndị njem.

 

Mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ na o nwere ka o si dapụta mmadụ a gaa ije abalị, onye ahụ ga-atọkịrị makana ọ gaghị ahụzi ọkada  ọ ga-eji laa. Nke a na-eme n’ihi na ọ bụghị ebe ọ bụna ka ụgboala na-agba. N’ime ihe nile, ọkada baara mmadụ nnukwu  uru ma ọ bụrụ na ndị na-anya ya hie asaa n’anya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here