Nwoke ịlụ nwoke na nwanyị ịlụ nwanyị bụ alọ – CAN

0
621

Chinwendu Uzoatu

 

CHRISTIAN Association of Nigeria (CAN)’ adụọna gọọmenti etiti ọdụ ka ọ ghara inabata ndụmọdụ nke onye ‘Prime Minister’ mba Britain bụ Theresa May nyere ya gbasara alụmalụ nwoke na nwoke na nke nwanyị na nwanyị ‘same sex marriage’.

 

May, onye kwuru nke a n’ọgbakọ ha nwere na Westminster, kwuru na e kwesighị inwe iwu machibidoro ụdị alụmalụ a.

 

Otu o sila dị, onye isioche CAN,  Olasupo Ayokunle, n’ozi nke e nwetara site n’aka onye ọlụ ya na mgbasa ozi, Bayo Oladeji, kwuru na alụmalụ nke Theresa May e sighi na Chineke, o sitere na ekwensu; na onye ọ bụna ńụjuru mmiri ara afọ ekwesighi inabata okwu ahụ n’Uwa nile, ọ kachaa na Nigeria.

 

Ọ gara n’ihu kwuo na Nigeria adila na mbụ kpebie na ha akwadoghi ụdị alụmalụ ahụ. O kwuru na Nigeria agaghi agbọchaa ma rachakwa n’ihi atụmatụ nke ‘Britian na ụdị alụmalụ ọ bụna nke adabaghị na Akwụkwọ Nsọ agaghi eguzo.

 

Ọ gara n’ihu kwuo “Chukwu bụ onye okike nke alụmalụ, ma ọ kọwara ya nke ọma na ọ gbasara nwoke na nwanyị. “Na mgbakwunye, Akwụkwọ Nsọ kwuru si: nwoke ga-ahapụ nne na nna ya wee rapara n’ahụ nwunye ya,ha e wee bụrụ otu ahụ” (Genesis 2:24).

 

“Jezọs, onye nzọpụta anyị gosipụtara na alụm dị na nwunye gbasara nwoke na nwanyị.” Mathew 19:4. Rev Ayokunle kọwara na atụmatụ Chineke gbasara alụm dị doro anya nke ọma. Nwoke na nwanyị na-anọkọ dị ka di na nwunye ma site na ya mụta ụmụ.

 

Ọ kọwapụtakwara ebe dị iche iche ọ dị n’Akwụkwọ Nsọ, ebe a katọrọ nwanyị na nwanyị. N’ọtụtụ ebe n’Akwụkwọ Nsọ ka a kpọrọ ya ihe arụ, ihe ihere, tinyekwara na ndị dị otu a agaghị abata alaeze Chineke.

GUO:  CAN etoola Chineke maka ịzọpụta Osinbajo

 

O kwukwara na ebe ọ bụ na Akwụkwọ Nsọ katọrọ ya na o doro anya na ọ bụghi uche nke Chineke, na ọ bụ njọ. O kwuru hoo haa, “Nke a bụ ọnọdụ Christian Associan of Nigeria’ (CAN); gọọmenti ọ bụna nwara anwa kwado ụdị alụmalụ a ‘same sex marriage’ ka ọ dị n’iwu abụghị so iwe Chineke ka ọ na-akpọkụ kama ma nke ndị otu Kraist tinyekwara ndị Nigeria bụ ndị maara ihe ekwe na-akụ.”

 

O kwuru na ọ bụladi ka ndị mba Britain na ndị mba ndị ọzọ kwadoro ya, omeghi ya ka ọ bụrụ ihe ziri ezi. CAN agaghị anabata ihe ọ bụla adaghi na ntụzi aka nke Chineke.

 

“British Prime Minister’ ga-amuru akọ site n’ụmụanụmanụ bị n’ọhịa. N’agbanyeghị na ha bụ anụọhịa, ha anabataghị mmekọ oke na oke ma ọ bụ nwunye na nwunye.

 

N’ikpeazụ, o kwuru na ụdị alụmalụ a dị njọ, na o so n’ihe Chineke jị kpochapụ Sodom na Gomorrah n’Akwụkwụ Nsọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here