Gọọmenti Anambra ga-enyocha ọkụ gbara ahịa Nkwogbe, Ihiala – Mmadubuko

0
516
Otu akụkụ ụlọ ahịa ahụ gbara ọkụ.

Izunna Okafor

 

ỌCHỊCHỊ steeti Anambra ga-eguzobe kọmitii ga-eme nnyocha banyere ọkụ ọgbụgba ahụ dapụtara ụbọchị ụka gara aga n’ahịa Nkwogbe dị n’Ihiala n’okpuru ọchịchị Ihiala na steeti ahụ.

 

Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’ọnụ kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka azụmahịa bụ Mazị Christian Mmadụbuko, oge o duuru ògbò ya nke na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Mazị C.Don Adịnụba, nakwa onyeisi oche nchere oge n’okpuru ọchịchị Ihiala, bụ Mazị Ifeanyịchukwu Ọdụmegwu na ọtụtụ ndị ọzọ selitere isi n’ọrụ gọọmenti, wee gaa n’ahịa ebe ahụ ya bụ mkpamkpa kpara.

 

Ka ọ na-agwa ndị na-azụ ahịa ebe ahụ okwu, ọ kachasị ndị ajọ ọnọdụ ahụ metụtara, kọmishọna Mmadụbuko, onye kwara arịrị banyere oke ihe mberede ahụ, mere ka a mara na òtù ahụ ga-eme ezi nnyocha zuru oke banyere ihe butere ya bụ ọkụ ọgbụgba nakwa ihe ndị ọ gbarikọrọ, ma dekọtasịkwa ahà ndị nke ahụ metụtara, na mkpụrụ ụbọchị ole na ole na-abịa abịa.

 

O mekwara ka a mara na gọọmenti steeti ahụ ga-arụnyesi ụlọ nsọnyụ ọkụ na nsó ahịa dị iche iche e nwegasịrị na steeti ahụ.

N’okwu nke ya, kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi, bụ Mazị C.Don Adịnụba, katọrọ ọkụ ọgbụgba ahụ, kasie ndị nke ahụ metụtara obi, ma kwekwa ha nkwa na ọchịchị steeti ahụ ga-eme ngwa ịgbatara ha ọsọ enyemaka. O jikwara ohere ahụ wee kelee otu nwoke a kpọrọ Mazị Udobi, bụ onye a kọwara na o bupụtasịrị ụgbọala ya o ji ebu mmiri, e wee gbanyụsịa ya bụ ọkụ ọgbụgba, na-anaghị ego ọbụla.

 

Ọkụ ahụ bụ nke e kwuru na ọ malitere ịgba n’elekere atọ nke ehihe ụbọchị ahụ, ebe otu onye ọnọ mgbe o mere na-akọwa na ọ bụ ikuku mmụọ e ji esi nri (cooking gas) gbagworo n’ime ótù ụlọ ahịa dị ebe ahụ, anwụrụ wee malite ịsụlisị elu, nke mezịrị ka ọkụ ọgbụgba wee binwuru ma gbarikọọ ngwaahịa gburu nde kwuru nde naịra.

GUO:  Ọkụ agbaala Nkwọ Ogidi

 

Ọbụnadị ndị nke ahụ metụtara ka a hụzịkwara ka ha ji nwayọ na-atụtụkọrọsị ngwaahịa ha ndị ọkụ gbafọrọ, ebe ọtụtụ ndị nọkwazị ebe ahụ wee na-emetere ha ebere, dịka ha na-akọrịkwa maka ya bụ ọkụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here