Ịchị ọchị dị mkpa na ndụ mmadụ

0
664

A KỌWAANA ịchị ọchị dịka otu ụzọ mmadụ ga-esi bie ogologo ndụ n’ụwa a. Ịchị ọchị na-egosi obi ańụri. Ọ na-egosipụta n’eziokwu na obi mmadụ dị ọcha.

Ọ bụ nke a so n’ihe mere mba ụwa ji wepụta ụbọchị ụka, ọnwa a ga-adị na mkpụrụ ụbọchị isii dịka ụbọchị ịchị ọchị ‘World Laughter Day’.

 

Nke a bụ iji gosi ndị mmadụ na ịchị ọchị bara nnukwu uru na ndụ mmadụ. Ịchị ọchị na-egosi ihu ọma, nke a mere na onye ọ bụna na-achị ọchị na-enweta amara n’aka ndị mmadụ. Ọ bụrụ na mmadụ chọọ inweta ihe n’aka mmadụ, ọ bụ ọchị ka ọ ga-ebu ụzọ chịara onye ahụ makana mmadụ dobe ihu ka onye ewu ya mụrụ mkpi mkpi, ọ gaghi enweta ihe o kwesiri inweta.

 

Onye ọ bụna na-achị ọchị bụ onye ndị mmadụ na-ahụ n’anya. A bịa n’ebe ụmụaka nọ, ha na-eji ya enweta onyinye n’aka okenye. Nwa e ku n’aka na-achị ọchị, ndị mmadụ na-ahụ ya n’anya ma na-ekughari ya makana ha na-ahụta ya dịka nwatakiri na-enwe obi ụtọ. Onye ọ bụna na-achị ọchị a naghị enwe mgbakasị ahụ makana ọchị na-achụpụ iwe na ọnụma.

 

Ịchị ọchị na-achụpụ ọrịa dịka ọbara mgbali elu. Nke a bụ eziokwu n’ihi na onye na-achịkarị ọchị a naghị ebu iwe n’obi. Mgbe nke a na-eme obi ya ga na-anọ n’udo mgbe nile.

 

Ọchị sokwa n’otu ụzọ ụmụ nwanyị ji aghọrị ụmụ nwoke. Ọ bụ site n’ọchị ka nwanyị na-esikari anata di ya ihe dị ya mkpa. N’agbanyeghị ihe isi ike dị n’ala Nigeria ugbua, a na-agwa ndị mmadụ ka ha jisi ike na-achị ọchị maka na nke a ga-eme ka ibu dịrị ha mfe. A na-adụzi ndị mamdụ ọdụ ka ha na-achị ọchị oge nile iji wee keta oke n’uru nile nke dị n’ịchị ọchị.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here