Ide mmiri a gbabuela nwa a mụrụ, tufue n’Ifite Awka

0
603

Izunna Okafor

 

N’IHI na a sị na chi na-efo, ihe ọjọọ a na-abawanye; ụbọchị ụka gara aga bụ nnọọ ụwa bịa lelee n’Ifite Awka dị n’okpuru ọchịchị Awka South nke steeti Anambra, dịka a hụrụ ozu nwatakịrị a mụrụ ọhụụ ma kechie ya n’àkpà n’ụsọ ebe ide mmiri si aga, n’okporo ụzọ ahụ siri Ifite wee gaa Mahadum Nnamdị Azikiwe.

 

Ya bụ ozu nwata na akụkọ so ya bụ nnọọ nke na-awụ akpata oyi, dịka otu onye akaebe na-akọwa na a tọgbọrọ nwatakịrị ahụ mgbe ọ ka dị ndụ, mana ide mmiri gbàgburu ya ma buruzie ozu ya sụtọba ya isi n’ọwà mmiri dị n’akụkụ okporo ụzọ ahụ, ka ụwa wee lelee.

 

N’okwu o kwuru ka a na-agba ya ajụjụ ọnụ, otu nwoke na-ere ahịa na mpaghara ebe ahụ, bụ onye ekweghị ka a mara aha ya kọwara nke ahụ dịka ihe jọgburu udele na njọ ma sigbuokwa nkakwụ n’isi, ma katọọ ajọ akparamagwa na nzuzu ụfọdụ ụmụnwaanyị, bụ ndị o kwuru na egwu Chineke adịghị n’ime ha ma ọlị. O kwuru na ọ bụ nanị onye enweghị uche, onye arabanko ma ọ bụ nwata nwanyị amaghị uru nwa bara pụrụ ime ụdị ihe ahụ.

 

Onye akaebe ọzọ kọwara onwe ya dịka Chii kwuru na ihe ahụ aghaghị ịbụ aka ọlụ nwata akwụkwọ, n’ihi na ọtụtụ n’ime ha pụrụ iji ka ha wee gbanahị ihere maka ime mkpuke ha tụtara, wee mee ihe mmadụ atụghị anya.
O kwuru na karịa igbu nwata ahụ, na nne ya gara akpọje ya n’ebe a na-elekọta ụmụaka enweghị nne na nna, n’ihi na ọ nweghị onye maara echi.

GUO:  Ndị Red Cross enyela ndị ide mmiri chupụrụ n'ụlọ ihe onyinye

 

Ka ọ dị ugbu a, e bupula ozu nwata ahụ dịka ndị bi na mpaghara ahụ siri wee kpọọ oku, ka o wee ghara ịnọ ebe ahụ regwòó.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here