Mba uwa ga-echeta ndị na-aghọ ụmụnwanyị nwa nwanne echi

0
593

Uchenwa Mba

 

ỌLỤ iji nwanyị ime bụ ọlụ dị mkpa nke ukwu. Ọ bụkwa ọlụ a na- akpachapụrụ anya nke ọma. Ọ bụ ọlụ a na-eji ịhụnanya n’amamihe alụ. onye ọ bụla na-alụ ọlụ ahụ kwesịrị ị bụ onye nwere obi ebere.

 

Iji ime, ịna nwa ma ọ bụ ịghọ nwa dịka ndị si asụ na asụsụ nke ha bụ ọlụ malitere na mgbe ochie mana ọ bụghị ọtụtụ mmadụ na-alụ ọlụ ahụ. Ọzọ, a dịghị amụ ya amụ n’oge ahụ.Ọ bụ onye ọ mara, ya bụ onye a na-alụ ya. Oke ọlụ a bụ ọlụ na esi na agbọ.

 

Ime mebe nwanyị, di ya ma ọ bụ ezigbo mmadụ nọ nso ejee chọba onye na-eji ime. Ọ bụrụ na ọ nọghị, e jebe agbata obi obodo ha ịga kpọ onye na-eji ime na ebe ahụ. Ezi ihe dị na oge ahụ bụ na ngwa ngwa achọtara onye ahụ, ma ọ bụ n’abalị ma ọ na-alụ ọlụ ọzọ, ọ hapụ ihe ọ bụla ọzọ oji sobe ndị ahụ chọtara ya ka o wee zọpụta ndụ nne na nwa ahụ. Ọ bata, o duru nwanyị ahụ gafee azụ ụlọ, nwa mgbe nta, Chukwu alụọ ya, a nụ olu nwa na nne ya.

 

N’oge ahụ, enweghị akwa ebe a na amụ nwa ma ọ bụ ihe a na-agba n’aka. Ihe ha ji alụ ọlụ bụ obere mma. Ọ bụ n’ala nkiti ka a na-amụtu nwa ahụ. E nweghị ihe dịka ‘izal’ na ‘detol’.

 

Ihe dị iche n’oge ahụ na ụgbụa bụ na ihe sie ike, ha adịghị ama ihe ha ga eme ka e wee zọpụta ndụ nne na nwa.Ọzọ, ọ bụrụ na ime metebe nwanyị aka, ọ dịghị ọgwụ ọ bụla ha na-agba nwanyị ahụ ma ọ bụ mkpụrụ ọgwụ ha ga-enye ya ka o wee nweta ume. Ọ bụrụ na nwanyị enwebe nsogbu ọbara ọgbụgba ma ọ bụ na onweghi ọbara, ọdighi ihe ha na-eme ọsisọ maka nke ahụ. Ọ bụ nani ọ bụrụ na onye ahụ na-eji ime mara mkpọrọgwụ na mkpa akwụkwọ.

GUO:  Ụwa ụmụnwanyị: Ụmụnwaanyị na ịzụ nwa (2)

Nwanyị mụsia nwa, enweghi ncha, ude ma ọ bụ ‘powder’. Ọ bụ nanị udeaki ka enwere na oge ahụ. Ị bata ebe a mụrụ nwa ọhụụ, ị ga na -anụ isi dị ańaa, ọkachasị ọ bụrụ onye amaghị ka o si edebe onwe ya ọcha.

 

Mmiri ọkụ bụ nanị ọgwụ nwanyị mụrụ nwa ọhụụ nwere, ọkachasi na ndida ọwụwa anyanwụ ala anyị. Ihe na ebụte isi oge ụfọdụ bụ na ihe ọgbara ọhụụ dịka ezigbo ncha, ude na ‘powder’ e ji eledo nwa ugbua adịghị n’oge ahụ. Ihe ndị ahụ ndị na-eji ime ji alụ ọlụ ha, adịghị eji mmiri ọkụ asa ha ma ọ bụ sie ha n’ọkụ.

 

Ọ dighị ihe ọ bụla ha ji asacha ngwa ọlụ ha n’ụzọ pụrụ iche. Ihe ndị a bụ ụfọdụ ọghọm ana enwe na oge ahụ ma mgbe ndị ọcha batara n’ala anyị, ha wee webata ọgwụ na ụlọ ọgwụ ebe nwanyị dị ime ga na-eje anara ọgwụ. Ha wee kuzie ụzọ ọgbara ọhụụ e ji aghọ nwa, ihe dị iche wee dịba.

 

Na ụbọchị Satọdee bụ ‘May’ 5, a ga-enwe mmemme icheta ụbọchị ụmụ nwanyị na-eji ime akpọrọ ‘International Day for Midwives’. Isi okwu nke ihe mmemme nke afọ a bụ 2018 bụ ‘Midwives Leading the Way With Quality Care’. Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị e ji enwe ọgbakọ na ihe nkuzi iji wee mara ụzọ ọgbara ọhụụ ha ga-esi na-alụ ọlụ a dị oke mkpa.

 

Ọ bụkwa ụbọchị ha ji eme ka ndị otu ha nọ nso na ndị nọ ebe dị anya, tinyere mba ụwa nile mara ihe ha na-alụ. Ihe mmemme a ha na-eme kwa afọ bụkwa nke na-enwe isi okwu ma ọ bụ ihe ha na-agbado ụkwụ na ya were na-eme mmemme ahụ.

GUO:  Mba ụwa echeta umụnwanyị bi n'ime obodo

 

Ụlọ ọgwụ a ndị ọcha webatara n’ala anyị nyere aka mee ka enwee ụzọ ọgbara ọhụ e ji ana nwa. Adịzịghị amụ nwa n’azụ ụlọ ma ọ bụ n’ala nkiti. Ọ bụzi n’elu akwa ka a na amụ nwa.

 

Ndị ọcha wee kụziere ndị ala anyị na malite na ọnwa mbụ nwanyị dị ime na ọ ga-eje deba aha ya n’ụlọ ọgwụ ebe a na-amụ nwa dị ya nso ka ndị ọ bụ ọlụ ha na-enyere ha aka, na-agbaziri ha.Dịka ha na -eje ụlọ ọgwụ, a ga na-enye ha ọgwụ dị iche iche maka ahụ ike nke ha na nwa ha bu n’afọ. Ọ dịkwa ọgwụ mgbochi ọria ọjọọ ụmụ nwanyị dị ime na-enwebe dịka ihe ọdụdọ ma nwanyị mụsia nwa ma ọ bụ nke n’adọ nwa ma amụsia ya.

 

N’oge ọgbara ọhụrụ a, akụrụ ngwa nile ha ji alụ ọlụ ha na-akpachapụrụ ha anya nke ọma, sie ha na mmiri ọkụ, tinye ya mmiri ọgwụ na-egbochi ụmụ nje ndị ahụ.

 

Ndị ọcha mere k’amara na ime sie ike,a gbawaa nwanyị afọ, kupute nwa, mechie afọ nwanyị ahụ, nwa na nne a dị ndụ. N’ezie Chukwu jiri ndị ọcha wetara mba Africa ụfọdụ nke ala anyị bụ otu n’ime ya ihe ọma dịka ọgbasatara ụlọ ọgwụ na ọmụmụ nwa. Ugbu a, ị bata ebe amụrụ nwa ọhụụ, ọ bụ nanị isi ọma ka ị ga-anụ n’ihi ngwo ngwo ọgbara ọhụụ e ji alụ ọlụ.

 

Ọgwụ ndị ahụ nne na-ańụ mgbe ọ dị ime na nke a na enye ma na-agbakwa nwa na-egbochi oria diị iche iche dịka isi, ngwụrọ, ntụrị aka ma ọ bụ ọkpa, ụkwara ọkpọtikọtikọ, ụkwara nta,wdg. Ọzọkwa, akụkọ ọjọọ maka nwanyị ịnwụ n’afọ ime adịzịghị ka ọ dị na mbụ. Ugbua nwanyị dị ime, o jee ụlọ ọgwụ je mara ma ọ bụ nwoke ka ọ bụ nwanyị ka ọ bu n’afọ. Ugbua, nwanyị dị ime enweghị ọbara, ebido n’oge nyebe ya ọgwụ ,ọ na-erikwa ihe ndị ga-enye ya ọbara n’oge. Ọzọkwa, nwanyị mụọ nwa ọhụrụ, nwa ahụ na-ebu ibu, maa mma mana ọ bụghị mmadụ ncha na-eku ya.

GUO:  Ụwa ụmụnwanyị: Ụmụnwaanyị na ịzụ nwa (2)

 

N’ezie gọọmenti agbakụtaghị ahụ ike nke ụmụ nwanyị dị ime azụ, ha na-agba mbọ na-ewunye ụlọ ebe ana amụ nwa ma na-eleba anya na ọgwụ na ezi akwa na akụrụ ngwa e ji amụ nwa dị na ebe ndị ahụ nile.

O kwesiri ka nwanyị ọ bụla dị ime were ọsọ ga deba aha ya n’ụlọ ọgwụ na-ahụ maka ụmụ nwanyị dị ime ka ọ ga abụ ụbọchị ọ ga-amụ nwa, o were ọchị lọta.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here