Ndị mmadụ ka na-akwa arịrị ogbugbu ndị ụkọchukwu na ndị ọzọ na Benue

0
640

Chinwendu Uzoatu

 

NDỊ mmadụ ka na-aga n’ihu na-akatọ ya bụ nnukwu ọdachị nke ahụ dapụtara na ‘St Ignatis Catholic Church’,Ayar-Mbalon, n’okpuru ọchịchị Gwer East na Steeti Benue. Ya bụ ọdachi nke ndị e chere na ha bụ ndị Fulani na-achị ehi nọrọ gbue ndị ụkọchukwu mmadụ abụọ, ‘Rev Fr. Joseph Gor ‘na ‘Fr Felix Tyolaha’, otu Katikist na mmadụ iri na anọ ndị ọzọ ka ha gara ụka ụzọ ụtụtụ.

 

Ọtụtụ ndị obodo ahụ ka e kwuru na ha merụrụ ahụ ebe ihe dịka ụlọ iri ise ka a gbara ọkụ. Ka ha kpachara mkpamkpa a, n’echi ya, ha gakwara n’ihu wakpokwa obodo ọzọ na steeti Benue ahụ ebe ha gburu ihe dịka mmadụ iri na atọ.

 

Bishop ụka Katolik nke Awka Dayasis bụ ‘Most Rev. Dr. P.C Ezeokafor’ akatọla arụ a. Otu aka ahụkwa, onye sinetọ na-ahụ maka ‘Anambra Central Senatorial Zone’ bụ ‘Sir’ Victor Umeh gwara ‘President’ Muhammadu Buhari ka ọ mara ihe ọ ga-eme makana okenye anaghị anọ n’ụlọ, ewu amụọ nwa n’ọgbiri.

 

A na-agwa ya ka a nwụchịkọọ ndị na-akpa mkpamkpa a, ma taa ha ahụhụ ka ndị ọzọ wee mụrụ akọ makana a gbaghị ụzọ owere mgba, ọ naghị echị.

GUO:  Ụka Katolik e chiela mmadụ iri na atọ ụkọchukwu n’Awka

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here