O kwesịrị ka a kwado ndị ọlụ ugbo

0
673
Ụfọdụ ụmụ nwanyị na-alụ ọlụ ugbo.

Uchenwa Mba

 

AFỌ ọbụla, a na-enwe oge ọlụ ugbo. Oge ahụ bụ oge e ji akụnye mkpụrụ dị iche iche n’ala, ma bụrụkwazie oge e ji akọ ji, akpụ, ede, nduku na ihe ndị ọzọ dị iche iche. Oge ahụ erukwago ọzọ n’afọ a. Ndị Igbo sịrị na ọ bụ aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ.

 

Na nke afọ a, ọ bụ ihe ga-aba uru nke ukwu ma ọ bụrụ na gọọmentị ala anyị nile ga-akwado ndị ọlụ ugbo n’ụzọ pụrụ iche n’ihi na ọ bụ na ọlụ ugbo ka e si enweta ihe oriri mmadụ na-eri. Ọ bụrụ na ndị ọlụ ugbo nwe ezi nkwado, agaghị enwe ụkọ ihe oriri n’ala anyị. Ndị ọlụ ọzọ dịka ndị ọlụ oyibo, ndị na-azụ ahịa, ndị ọlụ aka bụ ego ka ha na enweta ma onye ọlụ ugbo nwere ma ego ma ihe oriri. Ọ bụrụ na gọọmenti ala anyị nile nye ndị ọlụ ugbo nkwado site na inye ha ntụ e ji azụ ala bụ ‘fertilizer’ na ezi mkpụrụ akụkụ dịka osikapa, ọka, agwa, fịọfịọ na ndị ọzọ, nwa oge, ihe oriri adị nyafụnyafụ n’ala anyị.

 

Ndị ọlụ ugbo na-akụ ihe dịka azụ, ọkụkụ, ejula, ewu, atụrụ, ehi, ezi na ụmụ anụ ndị ọzọ chọkwara nkwado n’aka gọọmenti ala anyị. Oge ụfọdụ, nri eji azụ ụmụ anụ ndị a na-akọ, oge ụfọdụ, ọ gala ọnụ.Ọ bụ nke a na-eme onye zụpụta nke ya buru pụta ahịa, ọ gaghị ekwe ngota.

 

Site n’afọ ole gara aga, gọọmentị Anambra nwere ihe ịnya isi na ọlụ ugbo nye ndị mpaghara ọzọị n’ihi na a na-akọpụta akwụkwọ nri nke ana ebupụ mba ụwa ọzọ. E jirigokwa nke ahụ mara Anambra. Ọ bụrụ na gọọmentị nye ndị ọlụ ugbo n’akọpụta osikapa, akpụ, ji, jioko, nduku, ọka na ihe ndị ọzọ, ha wee kọpụta ihe ndị a na ụbara, a ga-enwe nke aga ebupụ obodo ọzọ iji nweta nke ndị obodo ahụ.

GUO:  Anambra agbapeela amụmà ọlụ ugbo nke afọ 2019

 

Ịkwado ndị ọlụ ugbo abụghị nanị inye ha ntụ e ji azụ ala (fertilizer) na ezi mkpuru akụkụ, o kwesịkwara ka enye ha ọzụzụ otu ha ga-esi malite ịkụ ụfọdụ ihe dịka ọkanwajata, cucumba, carrot, yabasi, water melon, ọpapa na ndị ozọ na ndịda ala anyị dịka Anambra, Imo, Enugu, Ebonyi, Delta, AkwaIbom na ndị ọzọ. Nkwado a gụnyere ‘federal’ na steeti gọọmenti ijikọ aka ọnụ ịkwado ndị ọlụ ugbo. Ọ bụrụ na gọọmentị nye ndị ọlụ ugbo nkwado nke ọma, onye ukwu na onye nta ga na-eriju afọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here