Obianọ ebulie mụọ ndị ọlụ elu

0
682

Kwekwa ha nkwa nrite ga-abia n’iru

 

 

Izunna Okafor na Uchenwa Mba

 

DỊKA mba ụwa merubere mmemme ụbọchị ndị ọrụ nke afọ 2018, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwela ndị ọlụ oyibo steeti ahụ nkwa na ihe ga-akawanyere ha mma dịka ụbọchị na-aga n’ihu.

 

Gọvanọ Obianọ, nke osote ya bụ Dọkịnta Nkem Okeke nọchiri anya ya, mere ka a mara nke a n’ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n’Awka ụbọchị Tuzdee, ahịa Nkwo, dịka ndị ọrụ steeti ahụ sonyeere ndị otu ha na mba ụwa n’imerube ya bụ oke mmemme. O kwere nkwa na ọchịchị ya ga-aga n’ihu n’ime ndị ọrụ oyibo mma na steeti ahụ, ma kwuo na ọ bụ n’ihi nke ahụ ka e guzobeworo otu ga-elebà anya n’ịkwalite ọdịmma ndị ọrụ na steeti ahụ.

 

N’ebe o doro anya, gọvanọ mere ka a mara na oge adịghị anya, na a ga-amalite itinye n’ọrụ na imezupụta ihe ndị kọmitii ahụ tụpụtasịrị dịka mpụtàrà ha, nke gụnyere ịkwalite ego a na-akwụ ndị ọrụ lagoro ezumike nka, ibunyesi ndị nọ n’ogoogo nhazi bụ ‘directors’ ụgbọ ala, ibulitekwu afọ ịga ezumike nka nke ndị ọrụ nọ n’ụlọ mmụta Nwafọr Orizu, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha na-ezube maka ndị ọrụ oyibo steeti ahụ n’izugbe.

 

Na mbụ, n’okwu ya, onyeisi oche otu jikọtara ndị ọrụ oyibo n’ala Nigeria, ngalaba steeti Anambra, bụ Mazị Jerry Nnụbịa, kelere Gọvanọ Obianọ maka mbọ dị iche iche ọ gbagoro na ndị ọ ka na-agba iji kwalite ọnọdụ ndị ọrụ oyibo na steeti ahụ, ma kwuwaa hoohaa na ha na-atụ anya na ọ ga-eji oge agba ọchịchị ya nke abụọ a wee kwalite ọdịmma na ọnọdụ obibi ndụ ha n’ụzọ pụrụ iche, n’ihi imirikiti nkwado ha na-enye ya.

GUO:  A kpọkuola gọọmenti etiti ka ọ kwụọ Anambra N43b o ji ya

 

Ọ kpọpụtara oke ọnụ ahịa inweta ụlọ obibi, na ụfọdụ ihe ndị ọzọ, dịka ihe na-echere ndị ọrụ oyibo aka mgba na steeti ahụ, ma kpọkuo gọọmenti ka o mee ngwa gbatara ha ọsọ enyemaka.

 

Onye isi TUC bụ Ifenayi Okechukwu kelere Akpokuedike maka ezi mekorita dị na etiti ya na ndị ọlụ. Ọ kelere odoziakụ gọvanọ bụ Chief Mrs Ebelechukwu Obiano onye Chukwu ji elekọta ụmụ ogbenye, ụmụnwayị ajadu na ndị enwe nne na nna. Okwu ya, otu osigbasa obodo anyị bụ Nigeria, ọ siri na ọ dị ọtụtụ nsogbu na echere ala anyị aka mgba.

Ọ yọrọ gọọmenti ka ghara ita baa onye ọ bụla ụta kama ka achọ ụzọ kama a ga-esi mee ka nsogbu ndị a nile kwusi. O kwuru maka enweghi ezi nchekwa nke juputara ala anyị ugbua butere ọrịa, ntọrọ, ogbugbu mmadụ, nsogbu ndị n’achị ehi na ndị ọlụ ubi na mmekpa ahuụ dị iche iche, enweghi ọlụ nye ụmụ ntorobia na ụkọ ego.

 

Ndị ọzọ sonyere na ya bụ mmemme gụnyere okwupụta okwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu na steeti ahụ bụ ọkaiwu Rita Madụagwụ nke osote ya bụ Mazị Harford Oseke nọchitere anya ya; onyeisi ọrụ na steeti ahụ, bụ Ọkaiwu Harry Udu, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ selitere isi n’ọrụ gọọmenti.

 

Ịkwụ n’ahịrị, na ịji otu olu kwee ukwe dara ụda, bụ nke ndị ọrụ oyibo steeti ahụ mere, so n’ihe pụtakarịchara ihe na mmemme ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here