Otu nwanyị adanyela n’ụmị ebe ọ na-ese mmiri

0
596

Chinwendu Uzoatu na Victor Mmaduagwuna

 

OTU nwanyị ka a na-akọwa na ọ danyere n’ime ụmị ma nwụọ ebe ọ na-esete mmiri. Nwanyị a bụ onye nwere nsogbu ọrịa akwụkwụ ma bụrụkwa onye na-azụ ma na erekwa ụmụ obere ihe dịka mkpụrụ osisi. Nwanyị a bụ onye e kwuru na ọ kabeghị nka, ọ ka nọ n’agbata etiti na ndụ ya.

 

Ọ dachị a bụ nnọọ nke dapụtara n’Ogechukwu Street n’Awka. Ọ bụ mgbe ọ gara isete mmiri n’ụmị n’ihe dịka elekere asaa nke ụtụtụ ka akwụkwụ ahụ bịara n’ike dọba ya nke mere ka ọ danye n’ime ụmị ma nwụọ pịị.
Nwanyị a, onye a kpọrọ aha ya dịka Ifeyinwa bụ onye Ugbenu nke dị n’okpuru ọchịchị Akwa North.
Otu onye bi n’ogbe ahụ onye nke aha ya bụ Justina tara ndị ikwunibe na ndị agbataobi nwanyị ahụ ụta. O kwuru na ọ bụrụ na ha nyeere ya aka ga-sete mmir,i na ọ kaghị ịnwụ.

 

Onye agbataobi ọzọ achọghị ka a kpọọ aha ya kagburu okwu onye nke mbụ ma kwuo na Ifeyinwa na-eseta mmiri n’ụmị ahụ ọtụtụ afọ nile ọ bi n’ụlọ ahụ. O kwukwara na ọ na-arụkwa ọrụ dị iche iche dịka ịga ahịa zụta mkpụrụ osisi ọ na-ere.

O kwuru si “Ana m eche na e deela na ọ ga-anwụ taa. Ọ bụrụ na ọ bụghị otu ahụ, ọ gaara isete mmiri ahụ n’enweghị nsogbu ọ bụna dịka o si ebe oge ọ bụna.”

 

A na-akọwa na e buputara ozu ya n’ime ụmị ahụ site n’aka onye igwu mmiri doro anya; onye nke banyere n’ụmị ahụ site n’ụdọ nke e kenyere na mbe

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here