A ga-edozigharị ọnọdụ ANPC – Adinuba

0
583

Chinwendu Uzoatu na

Uchenwa Mba

 

KỌMỊSHỌNA na-ahụ maka mgbasa ozi ‘Commissioner for Information and Public Englitenment,’ bụ Chief C. Don Adinuba wụchara n’ụlọ ọlụ ‘Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC)’, Awka, ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light na Ka Ọ Dị Taa.

Kọmishọna a bịara na ntụmadị ka ọ mata ka ọlụ si aga. Ndị ọlụ juputara n’ọńụ tinyekwara kọmishọna n’onwe ya. Onye isi ụlọ ọlụ a ‘Managing Director’ bụ Chuka Nnabuife ji obi ọcha wee nabata kọmishọna ma gwakwa ya na ọ bụ eziokwu na mberede nyịrị dike mana ọ bụkwa mberede ka e ji ama dike.

N’ime ihe nile, o duru kọmishona gaharịa na ngalaba dị iche iche nke mejupụtara ụlọ ọlụ a, ebe ndị ọlụ nọ kọwachaa onwe ha n’otu n’otu.

Ka e mechara nke a, ndị ọlụ nile zukọbara n’obi ụlọ ọlụ a ebe Mazị Adinuba nọ gwa ha okwu mwulite mmụọ dị iche ma dụkwa ha ọdụ dịka ezigbo onye ndu.

Na mbụ, Sir Nnabuife gwara ya na obi dị ndị ọlụ ya ụtọ n’ihi ọbIbịa ọ bịara ihụ ha. O kelere ya nke ukwu maka na dịka ọ bịara, o jirina anya ya hụ ka ihe nile si aga.

Okwuru maka ọnọdụ ọjọọ bụ nke ọhụrụ ụlọ ọlụ a nọ na ya dịka enweghị oche,’table’ ‘fan’, ọkachasị igwe ọgbara ọhụrụ bụ ‘Computer’ na ‘laptop’ ndị nta akụkọ nọ n’ebe ahụ ji alụ ọlụ na ihe ndị ọzọ. Okelere ndị ọlụ maka inwe ntachi obi na-alụ ọlụ na ọnọdụ dị otu a. Ọyọrọ ndị ọlụ ka ha gaa n’iru na erube isi nye ndị isi ha, na ya ga eburu ihe nile ya hụrụ bụgara gọvanọ.

GUO:  Ndị ọlụ na ndị rụrụ n'ANPC ekpeela ekpere nnabata udo

N’ikpeazụ, e nyere ndị ọlụ ohere ijụ ajụjụ; nke a mere ka ndị ọlụ jụọ ya ajụjụ Ufọdụ nke ga-enyere ha aka. O ji obi ańụrị nabata ma kọwara ha ihe ha jụrụ.
N’ikwu eziokwu ọbịbịa kọmishọna Adinuba bịara na ANPC bụ nọọ njem ihunanya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here