A gaghịm esi APC ma ọ bụ PDP wee zọ ọkwa onyeisi ala – Mọghalụ

0
607

Izunna Okafor

 

OSOTE onyeisi ụlọ ọba ego ala Nigeria n’oge gara aga, bụ Ọkammụta Kingsley Mọghalụ ekwuola hoohaa na ya agaghị esi n’otu ndọrọ ndọrọ APC ma ọ bụ PDP wee pụta ịzọ ọkwa onyeisi Nigeria na nhọpụta izugbe ahụ a ga-eme n’ahọ na-abịa abịa.

Ọkammụta Mọghalụ mere ka a mara nke a n’okwu ya na mmemme otu ụbọchị a chịkọbara na mahadum Nnamdị Azikiwe dị n’Awka, bụ nke a haziri site n’aka ‘Unizik Business School’.

N’okwu ya na mmemme ahụ nke isi okwu ya bụ “Mmezupụta Amụmà Ego Ọrụ: Ụzọ Ndọrọ Ndọrọ E Si Ekesa Akụnụba” nke pụtara n’asụsụ bekee – “Budget Implementation: The Political Economy of Resource Allocation” ; ọkammụta Mọghalụ, onye bụ nnukwu onye ọbịa nyere nkuzi n’ọgbakọ ahụ mere ka a mara na ihe kpọdòrò isi n’ala n’ebe o metụtara etú e si ahazi na etú e si ekesà amụma ego ọrụ ala Nigeria n’ihi na ọ bụghị nanị na a na-etinye ọtụtụ ego n’ihe abaghị uru ma na-agbakụta ihe ndị bara uru azụ, kama na chi na-efo, ndị mmadụ ana-adawanye ogbenye, ebe ọnụ ego a na-amapụta na-agbagowanye agbago.

 

O mekwara ka a mara na e nwere ọrụ ngo karịrị iri isii na isii a gbahapụrụ agbahapụ na mpaghara ebe dị iche iche n’ala Nigeria, bụ nke puku iri ise n’ime ha dị na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị (South East). Ọ kọwazịrị na ala Nigeria chọrọ onye ndú maara nke ekwe na-akụ, iji wee tinye ọgụgụ isi ya n’ịhazi ọnọdụ akụnụba Nigeria ka ụmụ mmadụ wee nwee ezi ọnọdụ obibi ndụ; ma kwuo na ọ bụ nke ahụ mere o jiri kwupute mmasị ya ịzọ ọkwa onye isi ala n’ahọ na-abịa abịa, n’ihi na ọgụgụ isi o nwetagoro na ebe dị iche iche ọ rụgoro ọrụ, nke gụnyere òtù mba ụwa bụ United Nations (bụ ebe ọ rụrụ ọrụ ihe karịrị ahọ iri na ise we ruo n’ọkwa osote onye kachasị elu n’òtù ahụ) na ya onwe ya nwere ihe ọ ga-ewe iji chịa, dozie ma hazigharịa ọnọdụ akụnụba ala Nigeria.

 

N’okwu nke ya, osote aka na-achị steeti Anambra bụ dọkịnta Nkem Okeke kpọkuru ndị ndú n’ebe dị iche iche ka onye ọbụla were nwa ntakịrị oge na ohere o nwere wee jee ozi ya nke ọma, ka ọ ga-abụ onye ahụ rụchaa rịtuo, e nwee ezi ihe na ọrụ ọma a ga-eji wee na-echeta ya. O kelere ọkammụta Mụọghalụ n’ihi na ọ gbọrọ ihe ewu na-eri site na nkuzi ahụ o nyere, ma tookwa ndị chịkọbara mmemme ahụ n’ihi ezi ngbanwe pụrụ iche nke ọ pụrụ iweta na ndụ mmadụ na n’ebe ndị ọchịchị nọ.

Na mbụ n’ozi nnọọ ya, onyeisi nhazi ‘Unizik Business School’ bụ Ọkammụta A.U Nnọyelụ, nke osote ya bụ Dọkịnta Chinedu Onyeizugbe nọchiri anya ya, kọwara na mmemme ahụ bụ agba nke abụọ ya, ma bụrụkwa atụmatụ òtù ahụ tụpụtara dịka ụzọ isi tụnye ụtụ pụrụ iche na ngalaba inwogharị ọnọdụ akụnụba ala Nigeria, ma bụrụkwa nke a na-eme kwà ahọ ọbụla, n’aha Dọkịnta Emmanuel Egbogah.

N’okwu nke ya, onye ọzọ nyere nkuzi mkparịta ụka na mmemme ahụ, bụ dọkịnta Okey Ikechukwu kọwara ikewapụta ohere dị larịị maka ihe mwunye nakwa itinye uchu n’ihe ndị dị oke mkpa dịka ụzọ a pụrụ isi wee nwogharịa ọnọdụ akụnụba ala Nigeria na ọnọdụ obibi ndụ ụmụ mmadụ bi n’ime ya.

Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere onyeisi mahadum Unizik, bụ Ọkammụta Joseph Ahaneku, nke onye nọchiri anya ya bụ Ọkammụta Caroline Arịzugbo; ode akwụkwọ izugbe steeti Anambra, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ, nke onye nọchiri anya ya bụ Dọkịnta Dan Ezeanwụ; Ọkammụta Stella Ọkụnna, bụ onyeisi isi ngalaba ọmụmụ ‘Social Science’ nke mahadum Unizik; Ọkammụta Chijioke Nwozuzu, bụ osote onyeisi nhazi ụlọ ọrụ ‘Emerald Institute’ nke mahadum Port-Harcourt; eze ọdịnala Awka, bụ Igwe Gibson Nwosu, nke onye nọchiri anya ya bụ ichie Benjamin Nwokoye; tinyere ichie Ugochukwu Udunze (Oke Ugo nke mbụ n’Ahịara Mbaise); nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here