‘BBC World Service’ ebido mgbasaozi n’asụsụ Igbo

0
1019

Pita Ejiọfọ

 

NDUBANYE: Ka ọnwa Febuwarị dị n’iri na itoolu (19) n’afọ a bụ 2018, ‘BBC World Service’ bidorụ mgbasaozi n’asụsụ abụọ ndị Naijirịa. Ha bụ, Igbo na Yoruba. N’echiche m, nke a abụghị obere ihe ọma mere n’ebe asụsụ Igbo dị. Ọ dị mkpa ka a kọọrụ ndị mmadụ ihe mere ihe a jiri bụrụ nnukwu ihe.

 

2. BBC ụwa n’asụsụ Awụsa

Ọ karịalarịị ọkara narị afọ BBC bidorọ ịgbasa ozi n’asụsụ Awụsa. Afọ atọ tupu Naijirịa enwere onwe ya n’Oktoba 1, 1960, ka ọnwa Maacchị dị na iri na atọ (13) n’afọ 1957, BBC bidorọ gbasawa ozi n’asụsụ Awụsa. Asụsụ Awụsa so n’asụsụ ụwa iri atọ na atọ (33) BBC na-agbasa ozi na ha mgbe ahụ. Onye mbụ gbasara ozi ahụ bụ Malam Aminu Abdullahi Malumfashi. E bidoro n’afọ 1958 gbasawa ozi ahụ kwa ụbọchi ruo taa.

BBC Asụsụ Awụsa na-ewu ewu nke ukwuu. N’ọnwa Maachị 2017,, BBC mere ncheta afọ iri isii o bidoro mgbasaozi n’asụsụ Awụsa. Onye Isiala bụ President Muhammadu Buhari zigaara ha ozi ekele, gwakwa ha na ya anaghị

ahapụlata ịnụ BBC Hausa mgbe ọbụla ya nwere ike. Ọ bụghị nanị President Buharị, ndị Awụsa ejighị ya egwurị egwu. Ọtụtụ ndị Awụsa anaghị ahapụlata ige ntị na redio ahụ kwa ụbọchị. Anyị ga-echeta na tupu President Umaru Musa Yar’adua azaa oku ka Chineke siri kpọọ ya, redio o kwuru okwu na ya ikpeazụ bụ BBC Mgbasaozi Haụsa. Ọ bụghị okwu asị ikwu na otu ihe soorụ mee asụsụ Awụsa jiri gbasaa n’akụkọ Naịjirịa ma ọdịdaanyanwụ Afrịka bụ BBC Asụsụ Awụsa.

Chetakwa na, bụraagodu oge ndị ọcha na-achị, na Gooment Naịjirịa nabatara asụsụ ndị Naịjirịa atọ ka asụsụ a ga-eji ha na asụsụ Bekee wee na-achị Naịjirịa. Asụsụ atọ ahụ bụ Awụsa, Igbo na Yoruba. Ma mgbe o dozịrị ndị British anya na Naịjirịa ga-enwerịrị onwe ya, otu ihe ndị ọcha mere iji nyere ndị Haụsa nnukwu aka bụ ịkwalite asụsụ ha. Ndị British maara mkpa asụsụ dị n’ijikọta agbụrụ ọbụla ọnụ na ime ka otu agbụrụ karịa agbụrụ ọzọ. Ha maara ka asụsụ English siri nyere ndị Ingland aka ikpanye ndị Skọtland, ndị Weels (Wales) na ndị Aịrishi (Irish) n’abụ n’ọchịchị British Aịls (Isle) nke bụ England, Scọtland, Wales na Ireland. E kwuola na ọtụtụ ihe ndị British mere na Naịjirịa mgbe ha na-achị bụ ihe e mere ka e tinye ndị Awụsa n’ọnọdụ ọchịchị Naịjirịa ga-eji bụ nke ha. Ha gbara mbọ nile ha nwere ike ịkwalite Asụsụ Haụsa. O so n’ihe kpatara na, n’ime asụsụ atọ a, na ọ bụ asụsụ Awụsa ka ha webatara na BBC hapụ asụsụ Igbo na Yoruba.

 

3. BBC ewere asụsụ Yoruba na Brokin (Pidgin) hapụ Igbo

Ka o ruru na Novemba 25, n’afọ 2015, BBC kwuwapụta na ọ ga-amalitekwu mgbasaozi n’asụsụ Yoruba na Pidgin. Nke a bụ na mbọ ọ na-agba ime ka ọnụọgụ ndị nwere ike ige ntị na BBC n’ụwa nile nke dị ugbua nde 308 ruzịa nde 500. Ọ bazịghị uru ikwuwe na Igbo adịghị ya.

O kwesịrị ido onye ọbụla anya na ọ bụrụ na e bidoraa BBC na Yoruba wee tinyere nke Awụsa ha nọrịị na ya kemgbe 1957, na a gaghị echetazị asụsụ Igbo maọlị. Oke ewee rie ihe onye mụ anya (ma ọ bụrụ na ndị Igbo mụ anya n’ihe gbasaara asụsụ Igbo). Mgbe ahụ, ọ gazịghị ete aka, e kwuwezie, dewekwuo, na asụsụ ndị Naịjirịa nabatara maka ịlụ ọlụ na Naịjirịa bụ Bekee, Hausa, Yoruba na Pidgin.

Ikekwe, BBC mechaa ga-etinyezị asụsụ Igbo, o ruorịị afọ ise, maọbụ afọ iri abụọ; ma, a taghị okwu eze, ebe afọ iri isii na otu gachara bido mgbe ha tinyere asụsụ Awụsa tupu ha tinye Yoruba (1957 ruo 2018), o nwere ike ruchaa afọ iri ise tupu e kwuwe okwu nke Igbo! O wee bụrụ na ọnwụ asụsụ Igbo ahụ a na-ekwu maka ya ana-akpụdewe nso. Onye a kpọwara aha ndị ụmụnna ya, ma akpọnyeghị aha ya, onye ahụ, ọ ka dị ndụ?

 

4. Chineke arụọ ọrụ pụtara Ihe: Mgbe echiche ihe a dinanyeere m n’ute, ka ọ dị ihe dịka ọnwa atọ na izuuka abụọ BBC kwuchara na ọ ga-ebido nke Yoruba na Pidgin ((November 25 ruo Eprel 4), otu enyi m nwoke bụkwa Odebeego Otu Sụwakwa Igbo bụ Mazị Oge Ezeajughị, onye Ọgbụ (Awgbu) dị n’okpuru ọchịchị Ime Obodo Mgbagoukwu Orumba (North), kpọọ m n’ekwenti ihe dịka n’elekere asaa nke mgbede, ka ọnwa Eprel dị n’ịtọ, afọ 2016, gwa m na otu onye ọcha na-arụ ọlụ na BBC Lọndọn, bịara Naịjirịa, ga-achọ ịbịa n’echi ya (Eprel 4, 2016) kpọtụrụ m na be m dị n’Ọka (Awka) n’elekere itoolu nke ụtụtụ kpọmkwem. Ngwangwa, m zie ozi, a kpọwa ndị Otu Sụwakwa Igbo ka ha bịa be m sorụ m nabata ya. N’ihi na ọ dị sukesuke, naanị ndị Otu Sụwakwa Igbo iri na otu bịara, tinyere otu onye ntaaakụkọ si Redio Naịjirịa Purity FM ,Mgbakwu. Aha ndị a dị na Nkọwada (Footnotes).

 

5. Onyeorụ BBC abịa be m n’Ọka (Awka): N’elekere itoolu ụtụtụ kpọmkwem, onyeorụ BBC Lọndọn bụ Producer, Radio Current Affairs bụ Mazi Michael Callagher wụchaa. Ndị duru ya wee bịa bụrụ Mazị Oge Ezeajụghị, onye Otu Sụwakwa Igbo; Dr Tony Nwezeigwe na-akụzi na Mahadum Naịjirịa, Nsụka, bụrụkwa onye Enugu State, na Mazị Nkem Ihejilika bụ onyeọrụ BBC, bụrụkwa onye Awka.

 

O zuchara otu awa (one hour) Callagher gbara m ajụjụ ọnụ, na-ajụrịrị m ihe kpatara ndị Igbo jiri hapụ asụsụ ha ọ na-ama afọ n’ala nke na a na-ekwu na ọ na-achọ ịnwụ. Mụnwa asaghepụghị ọnụ kwuchaa ihe kpatara ya n’ihi na o nweghị onye na-akọcha ka ọ dị ya. Ma mgbe ọ jụchaara m, m rịọ ya ka m jụọ ya nanị otu ajụjụ. O kwere, m wee jụọ ya sị, “Nnaanyịukwu, ị maara na asụsụ ndị Naịjirịa atọ ka gooment Naịjirịa nabatara iji rụ ọlụ na Naịjirịa. Kemgbe 1957 ka BBC na-agbasa ozi n’asụsụ Awụsa bụ otu n’ime ha atọ. O ruo na Novemba 25, BBC kwuo na ọ ga-ebido gbasawa ozi n’asụsụ nke ọzọ bụ Yoruba, tinyekwuorịị Pidgin esoghị na ha. (E gosịrị m ya akwụkwọ m budatara

 

(downloaded) n’intanet). Nna anyị, olee mgbe BBC ga-ebido gbasawa akụkọ n’asụsụ Igbo nke so n’asụsụ atọ ahụ?

6. Okwu onye BBC, Michael Callagher: Mazị Callegher zara m na ya tụrụ anya na m ga-ajụ ya ajụjụ ahụ. O wee nọrọ n’ihu anyị nile wee kwuo na BBC ga-ebido gbasawa ozi n’asụsụ Igbo n’afọ 2017.

Ụbọchị ahụ ka m hụrụ ihe bụ ańụrị ịgbu mmadụ ka mmanya. Ndị Otu Sụwakwa Igbo niile malitere n’otu mgbe, kelewe Chukwu, kelewe Mazị Callagher, nawa onwe ha aka, nwewe nnukwu ańụrị n’ihi na Mgbakwụ esorola ibe ya rachawa aka mmanụ. Mgbe Mazị Callagher nara, ndị Otu Sụwakwa Igbo kpebiri na ha agaghị eji ihe ha nọrọ wee mee okwu ebe ọbụla, ka ọhịa dị ka enwe amaghị ya, n’ihi na ndị anaghị echere Igbo ezigbo echiche nwere ike gbaa ndị Igbo mgba okpuru, BBC ewee kwụsị imeju nkwa ahụ. A sị na ọnọdụ ugo adịghị egbe mma.

Achọpụtara m na Mazị Callagher na ndị otu ya gakwuru njem n’akụkụ Naịjirịa dị icheiche na nyocha ha na-eme maka ajọ ọnọdụ asụsụ Igbo. BBC World Service mechaara n’ọnwa Eprel 26, 2016 mepụta “Documentary”na njem ahụ, nke ha kpọrọ “Forgetting Igbo”. Isi okwu Documentary ahụ bụ ịchọpụta ihe kpatara e ji echefu asụsụ Igbo nke so n’agbụrụ kachasị agbụrụ n’Afrịca. Onye bụ “Producer” ihe mmepụta ahụ bụ Mazị Callagher, onye nhazi okwu bụrụ Mazị Nkem Ifejilika. Mazị Callagher mechaara zitere m ya n’intanet, m butuo ya (download) na Julaị 1, 2017.

 

7. Ibidozị mgbasaozi BBC n’asụsụ Igbo: N’afọ 2017 nile, BBC ebidoghị igbasa ozi n’asụsụ Igbo, nke ọ na-ebido n’asụsụ Yoruba maọbụ Pidgin. Ma obi ekoropụghị anyị. Ma mgbe anyị maara na ihe e kwuru ga-enwe isi bụ mgbe nuzpepa Punch nke Nọvemba 17, 2016 buru ya n’akụkọ n’ibe 11(hx Akeem Lasisi, “BBC to broadcast in Yoruba, Igbo, others”).

E mechakwa, nuzpepa bụ Daily Sun nke Mee 22, 2017, kxq ekwe (advertise) n’ibe (page) 9 [chq nd[ qrx. Ndị Otu Sụwakwa Igbo bidorụ werezie ya mewe okwu. Ka o ruru na Febuwari 19, afọ 2018, okwe gbaa: BBC bido ịgbasa ozi n’asụsụ Igbo na Yoruba. O ruzie ka ọnwa Maachị dị na 21, afọ 2018, BBC mee mmemme itipụta mgbasa ozi a na Legọs site n’imepe ụlọọlụ ya na Legọs (hụ Job Osazuwa, “BBC launches Lagos Bureau, promises more impact” Daily Sun, Thursday March 22, 2018).

8. Ọlụ dịzịịrị ndị Igbo: Onye ọbụla maara na e nwere ike iji ụlọ mgbasaozi wee mebie, nwekwa ike were ya dozie. Ya bụ na nnukwu ọlụ dịịrị ndị Igbo. Ndị Igbo ga na-egekwa ntị na BBC Mgbasaozi Igbo, na-agwa ndị BBC ka ọlụ ha si aga, hụ na ihe a na-ekwu na ya bụcha nanị maka ọdịmma ndị Igbo. Ọzọkwa, ndị Igbo kwesịrị ịrịọwa ndị BBC ka ha bute ụlọọrụ ha maka asụsụ Igbo n’ala Igbo ka anya ndị Igbo wee na-eru nkeọma n’ihe a na-eme.

9. Mmechi: ikele ndị mmadụ: Onye mere e jiri bido BBC Asụsụ Igbo?

Ọ bụ Mazị Callagher gwara anyị na a ga-ebido ya, ka ọ bụ ndị duru Callagher bịa na be m, ka ọ bụ mụnwa jụrụ ya ajụjụ?

BBC, o kpebibuolarịị ibido mgbasaozi nke asụsụ Igbo tupu Callagher abịa be m, ka ọ bụ Callagher bịachaara, laa, rịọ ndị BBC ha bidokwuo nke asụsụ Igbo mgbe ha ga-ebido nke Yoruba? Mụnwa enweghị ike ịza ajụjụ ndị a, nanị ndị BBC ga-enwe ike ịza ya. Ọlụ anyị bụ ikele ndị BBC Lqndqn bidorụ ya, kelee Mazị Michael Callagher ziri anyị ozi ọma a, kelee ndị dutara ya na be m mere m jiri nwee ike jụọ ya ajụjụ, kelee ndị Otu Sụwakwa Igbo a kpọrọ, ha hapụ ihe nile ha nwere ime, gbara ọsọ n’ụzọ ụtụtụ wee bịa, we nabata Mazi Callagher na onye otu ya.

E kelekwuo mụnwa jụrụ ajụjụ mgbe m kwesịrị ịjụ, ọ dịghị njọ n’iihi na mgbe ụfọdụ, ndị Igbo na-echezọwa ịchọwa ihe gbasaara ha ka agbụrụ na-achọ sọ nke onwe ha. Ma e tere anụ, e tere azụ, nanị onye Igbo ọbụla ịna-asụ Igbo mgbe ọbụla e kwesịrị ịsụ ya, na-edekwa ya, na-agụkwa ya, ka asụsụ Igbo ga-eji kuwekwa ume ndụ.
Awka: Mee 02, 2018

 

 

Ejiọfọr bụ onyendu otu Sụwakwa Igbo Nig Initiative

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here