CAN agwala Buhari ka ọ kwusị ogbugbu a na-egbu ndị otu Krịstị

0
531

Chinwendu Uzoatu

 

NdỊ na-eso ụzọ Kraist a kpọkuola onye isi ala Nigeria bụ Muhammadu Buhari ka o mara ihe ọ na-eme banyere ogbugbu a na egbu ndị otu ha n’ala a. Ha gwara ya ka ọ mee ka ndị ọlụ nchekwa nke obodo a chekwaba ndụ ndị mmadụ, karịa nke ehi.

N’ihi nke a ‘Christian Association of Nigeria’ (CAN) ekpebiala ma mee ngaghariwe ndị otu Kraist, nke ụka dị iche iche mere na nso nso a n’okporo ụzọ dị iche iche n’ala Nigeria, iji gosi iwe ha maka ya bụ nnukwu ihe ọjọọ, makana a gbaghị ụzọ owere mgba, ọ naghị echi.

Ndị ụka a, nke onye ndu ha bụ onye isi oche CAN bụ Olasupo Ayokunle na-ekwusikwa ike ka a kpopụta ụmụaka Chibok na Leah Sharibu, otu n’ime ụmụaka nwanyị nke a tọorọ n’ụlọ akwụkwọ ha dị na Dapchi site n’aka ndị Boko Haram. Ndị otu ọjọọ a jidesiri nwatakiri a ike n’ihi na ọ jụrụ ịtụfu okwukwe o kwere na Kraist. Ụfọdụ n’ihe ha na-ekwu ka e mee nke si n’aka onye isi oche CAN gụnyere: na gọọmentị etiti ga-akwụsi ndị na-achị ehi igbu mmadụ; na President Buhari ga-echekwa ndụ na akụ na ụba ndị mmadụ; ọ bụghị ichekwa ehi; ozuola, bụ ogbugu mmegide a na-egbu ndị mmadụ.

John Akin Oyelade, bụ pastọ n’otu ụka so wee mee ngahari iwe a bụ ‘Fountain of Peace Baptist Church, Oyo’ kwuru na ndị otu Kraist e nyela gọọmentị ogologo mgbe iji mara ihe ọ ga-eme ọnọdụ a. Dịka o siri kwuo, Nigeria bụ obodo mmadụ nile, o kwesiri ka e si otu a nabata ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here