Igbusi Mmadụ: Jidenụ gọọmenti etiti – Igboezue

0
510

OTU a kpọrọ Igboezuo ”International Organisation Nigeria and the Diaspora” akatọọla kpam kpam mgbusi ahụ a na-egbusisi ụmụ mmadụ na mpaghara ebe dị iche iche n’ala Nigeria ma kwuo hoohaa na gọọmenti etiti bụ ụrụhụ tarakwụ, dịka ọ na-enwewughị ike ime ihe ọbụla iji kwụsị mgbusi ahụ tagoro ọtụtụ ụmụafọ Nigeria aka ha dị ọcha.

 

Onyeisi otu a, bụ Mazị Pius Okoye kwuru nke a megide okwu efu ahụ onyeisi ala bụ Muhammadụ Buharị kwuru nso nso a, na ọ bụ ndị nwere akpọmasị megide udo na ịdị n’otu dị n’ala Nigeria na-akwalite mgbusi ahụ ndị Fụlani na-achị ehi na-egbusi ụmụ mmadụ, iji wee mee ka agha daa n’ala Nigeria ma ọ bụ wee ghasaa udo dị ya.

 

Ọ katọrọ okwu ahụ onyeisi ala kwuru ma kwuo na o nwee ihe ọbụla mere ụmụafọ ala Nigeria, na ọ bụ n’aka gọọmenti etiti ka ọ dị, na ọ bụkwa gọọmenti etiti ka a ga-ejide, maka na ọ gara n’ihu nọdo eziokwu ala n’elu, raa ntị mmanụ, ma kụkọsịa aka ya, mee ka aga asị na ọ bụghị mmadụ nwe ọgọdọ ewu na-ata.

 

O mere ka a mara na otu ndị Fụlani na-achị ehi siri wee na-asụ ụmụ mmadụ akwụ ma na-anyụlasịkwa ahụrụ elu na mpaghara ebe dị iche iche n’ala anyị, na-enweghị onye ọbụla sịrị ha ihe ma ọ bụ nwụchikọọ ma taa ha ahụhụ, gosiri nnọọ na gọọmenti etiti bụ okenye nọ n’ụlọ ma ewu amụọ n’ọgbụ, ma bụrụkwa ọma ụma achàrá esu.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here