Ndị Igwe Anaọcha echiela Obianọ Odozi Obodo

0
792
Ndị Igwe Anaocha, mgbe ha na-echiị Gọvanọ Obianọ, onye Dokịnta Nkem Okeke nọchitere anya ya na echichi n'ọgbakọ ahụ.

Izunna Okafor

 

Ọ BỤ nnọọ ihe nnukwu ọṅụ ebe obodo jupụtakwara kpụm n’ọnụ dịka e chibere aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ oke echichi pụrụ iche dịka Odozi Obodo.

Nnukwu echichi a bụ nke e chibere ya bụ agụ nwoke site n’aka obodo iri mejupụtara okpuru ọchịchị Anaọcha nke steeti ahụ, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n’oge a na-eme mmemme ụbọchị Anaọcha, bụ nke e mere n’isi ụlọ ọrụ okpuru ọchịchị ahụ dị na Neni.

N’okwu ya n’echichi ahụ, eze ọdịnala Agụlụ ma bụrụkwa onyeisi oche otu jikọtara ndị eze ọdịnala nile nọ n’okpuru ọchịchị Anaọcha, bụ Igwe Innocent Obodoakọ kọwara echichi ahụ dịka nke kwesiri ekwesi, n’ịgbakwasa ụkwụ n’ọrụ mmepe na otụtụ ọrụ ọma nile dị iche iche nke Gọvanọ Obianọ rụgoro na steeti ahụ.

Ọ kọwara Gọvanọ Obianọ dịka nwoke jigoro ịgbasi mbọ ike ya na ezi amamihe Chineke jiri chọọ ya mma wee rụpụta ihe a hụrụ anya, dozie, hazie ma mepee steeti Anambra na obodo dị iche iche dị n’ime ya, ma mezie ka ọ bụrụ e ji ama atụ, bụkwazị nke na-egosi nnọọ na echichi ahụ bụ nke kwesiri ekwesi.

Na nzaghachi, Gọvanọ Willie Obianọ, nke onye nọchiri anya ya bụ osote ya bụ Dọkịnta Nkem Okeke kwuru na obi juputara ya nnọọ n’ọṅụ n’ihi echichi ahụ dị oke elu, ma sị na nke ahụ bụ nnọọ ihe agbamume nyere ya. O kelere ndị Anaọcha nile banyere nke ahụ, ma kwekwazie nkwa na ọ ga-arụrụ ọrụ ọma ya gaa n’ihu n’ụzọ pụrụ iche n’agba ọchịchị ya nke abụọ.

N’okwu nke ya na mmemme ahụ, ọká okwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ, bụ Oriakụ Rita Madụagwụ toro ndị Anaọcha maka ịtụpụta ụdị atụmatụ ọma dị otu ahụ, bụ nke ọ sị na ọ magburu onwe ya, ma kpọkuziekwa okpuru ọchịchị ndị ọzọ ka ha ñomiri nke ahụ, ọ bụnadị dịka o kwuru na nke ahụ ga-enye aka n’ijikọta obodo ọnụ.

GUO:  Ọkọchị: Obianọ agwala ndị na-arụ okporo ụzọ ka ha chighaa ebe ọrụ ha dị

Na mbụ n’ozi nnọọ ya, onyeisi oche nchere oge okpuru ọchịchị Anaọcha, bụ Mazị Ikeobi Ejiofo kọwara na otu n’ime ebumnobi e jiri chịkọba ọgbakọ ahụ bụ ka e wee kwalite ma tutekwa mmụọ ịdị n’otu n’etiti ndị Anaọcha, ma keleziekwa ndị nile gbara mbọ n’ụzọ pụrụ iche iji mee ka nrọ ahụ pụta ihè.

Na ntụnye nke ya, onyeisi oche na mmemme ahụ ma bụrụkwa onowu n’obodo Neni, bụ Chiifu Anthony Enukeme, bụkwa onye e chibere echichi na mmemme ahụ dịka ‘Anya Anaọcha” kelere ndị Anaọcha maka ịhazi ya bụ mmemme, bụ ụdị nke a hụtụbeghị, ma kpọkuo ha ka ha jisie ike n’ịdị n’otu na ijikọ aka ọnụ, ọ bụnadị ka o kwuru na nke ahụ na-akwàlite mmekọrịta udo na ịhụnanya n’etiti ụmụ mmadụ.

Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere: Mazị Victor Umeh, bụ onye nnọchi anya ọgbọ nta nkwado Anambra Central n’ụlọ ogbakọ ukwu sinet ala anyị, ma bụrụkwa onye e chiri echichi dịka ‘Ugwumba Anaọcha; kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ihe metụtara ọdịmma ụmụntakịrị na ndị nne, bụ Oriakụ Ndidi Mezue; onye ji ọkwa n’ụlọ nkwari akụ Golden Tulip bụ Mazị Patrick Chidolue, ma bụrụkwa onye e chiri echichi dịka Nnabụenyi; onyeisi ụlọ mgbasa ozi Anambra Broadcasting Service’, bụ nze Uche Nwọra, Onyeisi ụlọ ọrụ ‘Local Government Service Commission’ Mazị Peter Egentị; onyeisi ndú òtù obodo Neni, bụ Mazị Chukwudị Mbọnụ, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

A nọrọ na mmemme ahụ wee gbapee mmiri a gbapuru ọhụụ na ụlọ ezumezu a rụrụ ọhụụ, bụ ndị a kpọkwasịrị aha Mazị Enukeme; gbaa egwu mmọnwụ, ma kụkwaa ngazị n’eze.
Mmemme ụbọchị Anaọcha bụ nke a malitere kemgbe 1997, ebe nke a bụkwa agba nke atọ ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here