Otu ‘Red Cross’ na uru ọ bara

0
626

Uchenwa Mba

 

 

ARỤ ike bụ ihe dị mkpa n’ebe ihe nile na eku ume ndụ dị. Ọ bụrụ na arụ ike diri mmadụ ma ọ bụ anụmanụ, ọ ga-enwe ike ịga ebe ọ bụla ma ọ bụ mee ihe ọ bụla ọ chọrọ ime. Osisi, n’otu aka ahụ, chokwara arụ ike maka na ọ bụrụ na onweghi arụ ike, mmadụ e were ya sie ihe ma ọ bụ gbutuo ya.

Ọ bụrụ na mmadụ enweghị arụ ike, ọńụ ya agaghị ezu oke, ọ gaghị erinwu nri, ọ gaghị ekwu okwu otu okwesiri. Otu ahụ ka ọ dị n’ebe anụmanụ nọ Ọ bụkwa mgbe arụ ike adịghị ka ọnwụ ji egbu ihe ọ bụla na-eku ume, ọkachasị mgbe mmadụ enweghị ego iji lebara onwe ya anya.

Ọ bụ nke a mere na-enwere ngalaba aru ike akpọrọ ‘Red Cross’. Ngalaba a na-ahụ maka aru ike nke ndị mmadụ na oganiru ha n’ụzọ pụrụ iche, ọkachasi mgbe nsogbu ọrịa, agụụ, agha ma ọ bụ ihe ndaba dị iche iche na-adapụta na mbe ụwa dị iche iche. N’ihi ọlụ a dị oke mkpa nke ndị ‘Red Cross Society’ na-alụ, e wepụtara otu ụbọchị ka ha were na eme ka mba ụwa nile na-amara ọlụ ha na ebumnobi ha. Mmemme a bụkwa nke ha mere abalị abụọ gara aga.

 

Gịnị bụ ebumnobi e ji eme mmemme a? Gịnị kpatara e ji eme icheta ụbọchị ndị ‘Red Cross’? Ọ bụ onye ma ọ bụ ndị hibere otu ‘Red Cross’? Gịnị kpatara e ji wepụta otu ụbọchị ahụ kpọọ ya ‘International’ ma ọ bụ ‘World Red Cross Day’.

GUO:  Ndị Red Cross enyela ndị ide mmiri chupụrụ n'ụlọ ihe onyinye

Otu a bụ Red Cross bụ otu na-ahụ maka arụ ike nke ndị mmadụ ma na-enyere ndị na-ata ahụhụ maka agha, agụụ ma ọ bụ nsogbu ala ọmajiji, mmiri isụpụta buru ndị mmadụ n’akụ na ụba ha laa n’iyi. Ụbọchị ndị ‘Red Cross’ bụ nọọ nke mba ụwa nile na esonye na ya na ‘May’ 8 kwa afọ .

Ụbọchị ahụ bụ oge ha ji egosi ka ha si azọpụta ndụ ndị mmadụ ma na-enyekwara ha aka. Ọzọkwa, ọ bụ ụbọchị ha jikwa egosi otu ha si enyere ndị si n’ebe onweghi ka ọra ha pụta aka. Otu aka ahụ, ọ bụ ụbọchị ha ji echeta ọmụmụ nke otu nwamadi a kpọrọ Dunant Henri. Ndị ‘Red Cross’ na-enyere ndị mmadụ bụ ndị nwere nsogbu ihe oriri n’ala ha ma ọ bụ ndị alaomajiji dakwasịrị site n’ikesara ha ihe ndị ga eme ka nsogbu ha belata.

Ọ bụ ụbọchị ha jị ewepụta ọtụtụ ihe dị mkpa na mmemme ha, ọ bụkwa oge ndị mmadụ ji ewepụta ọtụtụ ihe bara uru iji kwado obibi ndụ nke ndị nọ n’mkpa. Ha jikwa oge mmemme ha eme ka ọtụtụ ndị a maara aha ha na gọọmentị isonye na ọlụ ahụ dị oke mkpa.

Ọtụtụ mmadụ bụ ndị so na otu a bụkwa ndị na-adi njikere mgbe ọ bụla inyere ndị nọ na mkpa aka maka na ọlụ ‘Red Cross’ bụ karịrị ọlụ ebere. Ndị otu ọlụ a bụkwa ndị enyere ohere ilụ ọlụ inye aka na ụzọ dị iche iche dịka ikesara ndị nọ na ọnọdụ dị ala ihe ha ga eji nyere onwe ha aka.

GUO:  Ndị Red Cross enyela ndị ide mmiri chupụrụ n'ụlọ ihe onyinye

Ha kwupụtakwara ọtụtụ mba na ndị mmadụ ha na ekesara ihe iji nyere ha aka. N’ezie, isonye na otu ọlụ ‘Red Cross’ ga-eme ka mmadụ nwee ụzọ iji nyere ndị nọ na mkpa na obodo dị iche iche aka.

Ndị otu ‘Red Cross’ nọrọ n’ụbọchị mmemme a kọwapụtara ndị mmadụ ebumnobi ha na kwa ihe ha chọrọ ime ka ndị mmadụ beleta agha na ọtụtụ nsogbụ nke na-esite n’aka mmadụ adakwasi ibe ha. Ha jikwa ụbọchị mmemme ha mee ka ndị nsogbu ọnatarachi mara na olile anya dịrị ha.

 

Ọzọkwa, ka ha jidesie obere ihe ọ bụla pụtara ha ka ndụ ha wee dị mma ọzọ. Ọlụ ọzọkwa ha na-alụ bụ na ha na-eme ka amara na-egosikwa ndị mmadụ ụzọ ha ga-esi beleta ọtụtụ ọnwụ ma ọrịa ọjọọ bụla dakwasa obodo ọ bụla. Ndị otu a n’akụzikwara ụmụ ntorobịa ka ha ga- esi na-enyere ndị nsogbụ ọ bụla dakwasirị aka na be ha ka ndụ were fọdụ.

Ndị otu ‘Red Cross’ na-agba mbọ hibe ebe ha na-anọ elekọta ndị nwere nsogbu bụ ‘camps’. Ha na-agbakwa mbọ hụ n’ebe dị otu ahụ, na ihe akọghị ha dịka mmiri, nri, akwa, ọgwụ n’okwu nkasiobi. Kwa afọ ọ bụla, site na njikọ aka nke gọọmentị na ndị ‘Red Cross’, a na- ewepụta isi okwu nke ga enyere ha aka na igba mbọ. Ha malitere n’afọ 2009 wee rue n’afọ 2018. Ha nwere ọtụtụ isi okwu. Na nke afọ 2018, ha kpọrọ isi okwu ha “Memorable Smiles from Around the World”.

N’ụbọchị mmemme a, ha kpọpụtara ndị maara ihe nke ọma na otu ha ka ha kuzie ihe gbara ọkpụrụkpụ. Ha mekwara ka ndị ụlọ mgbasa ozi ọ bụla sonye n’ọlụ a ka mba ụwa ọ bụla mara ihe ha na-eme. Ọ kwesịrị gọọmentị na ndị ihe mmadụ ibe ha n’adị mma kwado ndị ọlụ Red Cross ka ha na alụ ọlụ ha, mana aba n’ ime ime obodo inyere ndị nọ n n’arụ ụfụ aka.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here