Ụmụakwụkwọ karịrị iri ise na ise apụtala n’otu nzuzo na COOU

0
587

Chinwendu Uzoatu

 

ỌKAMMỤTA Greg Nwakoby, bụ onye isi ‘Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University’ adọọla ndị nkuzi nke mahadum a aka na ntị ka ha ghara ị dị na-anapụ ụmụ akwụkwọ ego iji wee gafee ha n’ule ma ọ bụ na-akwasa ndị nwanyị iko. O kwuru na onye nkuzi ọ bụna dara iwu a na-aga achụ ya n’ọlụ.

Ọ gakwara n’ihu kwuo na onye nkuzi ọ bụna eweputaghị mpụtara ule ‘result’ n’ime otu ọnwa e lere ule na-agaghi akwụ ya ụgwọ ọnwa ya n’oge ma ọ bụ ọ hapuzie ya. Ọ gara n’ihu kwuo na oge agaala bụ mgbe ụmụ akwụkwọ ji mpụ agafe n’ule.

Ọ gwakwara ụmụ akwụkwọ ka ha kpee onye nkuzi ọ bụna si n’aka onye isi klassi ere akwụkwọ nke o dere n’onwe ya ma ọ bụ onye na-esogbu ndị nke nwanyị maka ikwa iko. Dịka o kwuru, onye ọ bụna e nwetara na-eme nke a, a ga-achu ya n’ọlụ.

Ọkammụta Nwakoby chetara ụmụ akwụkwọ na ebumnobi ha jiri bịa na mahadum ahụ bụ maka mmụta. Ọ gwara ha na ha ga-abụ ndị nwere ezi mmụta ma nwekwaa agwa ọma tupu ha ahapụ mahadum ahụ. Ọ dụkwara ha ọdụ ka ha were ịgụ akwụkwọ ha kpọrọ ihe.

Ọkammụta Nwakoby kwuru okwu ndị a mgbe ọ na-agwa ụmụakwụkwọ karịrị iri ise na ise n’ọnụ ọgụ okwu, bụ ndị nke si n’otu nzuzo dị iche iche n’ụlọakwụkwọ ahụ pụta.

Emume a bụ nke e ji ụka ‘Interdinominational service’ nke ndị isi ụlọ akwụkwọ mahadum a site na ngalaba dị iche iche, ndị echichi, ndị nkuzi, tinyekwara ndị mahadum ahụ jiri biri bịara

GUO:  Mahadum COOU amalitela ịrụpụta sanịtaịza

. Ọkammụta Nwakoby kwuru na ndị nile pụtara n’otu nzuzo a abụrụna ndị Chineke zọpụtara.
Ven Joshua Onuora, nke ngalaba ‘Accountancy’ chetara ụmụ akwụkwọ ahụ na ọ bụ ka ha sị mezie akwa ha, ka ha ga-esi dina na ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here