Aka ndị uwe ojii akarala nwoke gburu nne ya maka ọgwụ ego

0
635
ọchụ

Izunna Okafor

 

AKA ndị orụ uwe ojii na steeti Anambra akpàrala otu nwoke gbara ahọ iri ise na abụọ, bụ Mazị Christopher Ọkadigbo, onye a na-enyo enyo na o gburu nne ya bụ Oriakụ Rosaline Ọkadigbo gbara ahọ iri asatọ na abụọ ka o wee gwọchara ọgwụ ego.

N’otu aka ahụ, enyi nwoke onye ahụ a na-enyo enyo, bụ Mazị Ameke Udolu bụkwa onye a nwụchikọrọ dịka onye a na-enyo enyo na o soro kpaa nkàtà ọgwụ ego ahụ.

N’ajụjụ ọnụ a gbara ya na be ya bụ Nando dị n’okpuru ọchịchị Anambra ‘East’, Chiifu Innocent Ọkadịgbo, bụ nwa nwoke mbụ nke nwanyị ajàdụ ahụ e gburu egbu kwuru na ahụ zuru nne ya okè tupu ọnwụ ya, ma sị na nne ya kpọrọ ya n’abalị mbụ nke ọnwa Mee ma gwa ya na ọ ghọtaghị ka nwanne ya nwoke ahụ bụ Christopher na enyi ya nwoke ahụ bụ Ameke si bàta n’ime ụlọ ya, ma na-agbagharị okiriki ebe ahụ, na-ekwugasị ihe dị iche iche mmadụ apụghị ịghọta, dịka a ga-asị na ha na-agba afa.

Ọ sịkwa na nne ya gwara ya na kemgbe ụbọchị ahụ, na egwu na-atụ ya ibi n’ụlọ ahụ nanị ya n’ihi ihe ahụ ha mere n’ime ụlọ ya, ma sị na ka ọ gachara otu ụbọchị, na ihe ọzọ ọ nụzịkwara bụ ka otu onye agbataobi ha bụ Pius Aniefule kpọrọ ya n’ekwe ntị sị ya na ọ hụrụ ebe ozu nne ya tọgbọrọ n’ogbu ọbara. O kwuru na ngwa ngwa nke ahụ gachara, na nwanne ya nwoke Christopher, bụ onye akpọbeghị ya kemgbe ahọ 1999 kpọkwara ya n’ekwentị gwa ya na nne ha anwụọla, ma sị na ya onwe ya gabara njem na Minna nke steeti Niger, ndị mmadụ wee kpọọ ya na-agwa ya ihe ahụ.

GUO:  Nwokorobịa e gbuola nna ya n’Abatete

Dịka akụkọ siri kọọ, Oriakụ Rosaline Ọkadịgbo bụ onye e gburu, ghụkọrọ anya aka ekpè ya na mkpụrụ obi ya. Nke a mezịrị Pius jiri tibe mkpu oge ọ hụrụ ihe ahụ, ndị mmadụ wee gbakọọ n’ebe ahụ. Ma mgbe nke ahụ na-eme, ihe ọzọ a hụzịrị bụ ka Ameke siri n’otu ime ụlọ nwanyị ahụ gbapụta, ndị mmadụ wee chụba ma nwụchikọọ ya, nara ya ekwentị ya ma site na ya chọpụta mkparịta ụka ya na Christopher, bụ onye a chọpụtara na ọ gwara ya gbara ọsọ bịa chere ya n’isi ụzọ Nteje ngwa ngwa ọ kpachara arụ ahụ, ka ha abụọ wee soro larie; ụmụ okorobịa nọ ebe ahụ wee malite ịhọ ya aka ururu họrọ ogbe ogiri.

N’okwu nke ya, onyeisi ọchịchị obodo ahụ bụ Chief Ignatius Aghadinunọ, onye zọrọ Ameke Ụbọchị ahụ, kwuru na obi luru ya ilu nke ukwu oge ọ bịaruru ebe ahụ wee hụ ozu nwanyị ahụ na etu e siri bọkasịa ya, ma hụkwa ndị ntorobịa ahụ iwe juru n’obi, na Ameke, bụ onye ha tigoro gwoo gwoo, nke mezịrị ka ọ kpọọ ndị ọrụ nchekwa ka ha wụchaa n’ebe ahụ, bịa kpụrụ ya. Otu ọ dị, Mazị Christopher ahụ bụzịkwa onye a nwụchikọrọ ebe ọ na-ezogharị na nke otu onye dibịa, wee hafekwa ya n’aka ndị ọrụ uwe ojii.

N’aka nke ya, nwanne nwanyị ahụ e gburu egbu bụ Chiifu Uyammadụ Anaeliakụ kwuru na ọ bụghị ụbọchị ahụ ka Christopher bidoro gwọba ọgwụ, kọọ na ụmụ iteghete n’ime ụmụ iri na otu nwanyị ahụ mụrụ anwụọla n’ụzọ mmadụ apụghị ịkọwa, ma kpọkuzie gọọmenti steeti ahụ ka o nye aka hụ na a bọpụtasịrị ọgwụ nile e liri n’ụlọ ahụ.

GUO:  Na Germany, nwoke agbagbuola nne, nna na ikwu ya mmadụ anọ, merụọ abụọ ahụ

Mmadụ abụọ ahụ nọzịkwa n’aka ndị uwe ojii ugbu a, ebe onye ndu ndị uwe ojii kwere nkwa na ha ga-eme nnyocha ghe anya oghe iji hụ na e sogidere okwu ahụ wee ruo n’ebe ọ kwụsịrị.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here