Asụsụ

0
568
Asụsụ
Asụsụ

Victor Maduagwuna

 

ASỤSỤ bụ ụzọ mmadụ na ibe ya si emekọrita. Ọ bụ site n’asụsụ ka ndị mmadụ si akọwa onwe ha.

 

Asụsụ na-eme ka ebumnuche ndị mmadụ pụta ihe. Ọ bụ site n’asụsụ ka e si aghọta ihe ndị mmadụ bu n’uche. Asụsụ na-eme ka a amata ebe mmadụ si na onye mmadụ bụ.

Asụsụ bụ okwu mmadụ na-ekwu n’ọnụ. Ọ bụ olu ka e ji asụ asụsụ. Ọ bụ ya mere na e nwere ike ịsị na asụsụ bụ ụdaolu mana ọ bụghị ụda ọbụla e mepụtara nwere nghọta. Ọ bụrụ na onye si mba ọzọ na-ekwu okwu n’asụsụ ya n’ebe ndị anaghị anụ asụsụ ya nọ, ha ga-anụ ụda si n’ọnụ ya pụta mana ha agaghị aghọta ihe ọ na-ekwu.

Ha nwere ike ịsị na onye ahụ na-eme mkpọtụ makana ha aghọtaghị ihe onye ahụ na-ekwu. E nwere ike ịsị na asụsụ bụ ụdaolu nwere nghọta nke ndị mmadụ ji emekọrita ma ọ bụ akpakọrita ụka mana nke a ga-abụ n’etiti ndị nwe asụsụ ahụ ma ọ bụ ndị maara asụ asụsụ ahụ, ma ọ bụ ndị na-aghọta ya.

Asụsụ dị n’ụwa bara ụba otu ndị nọ n’ụwa siri ba ụba. E nwere asụsụ bekee nke a na-akpọ ‘English’. E nwekwara ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ dịka ‘French’ na ‘German’ n’obodo ndị bekee.

Nigeria bụ nnukwu obodo. Ebo bi na ya dị ọtụtụ. Asụsụ e nwere n’ime Nigeria bara ụba. N’ugwu Nigeria, e nwere otu asụsụ ndị bị n’ugwu na-asụ dịka Fulani, Hausa, Tiv, Idoma, Igala wdg. E nwekwara ọtụtụ asụsụ dị iche iche ndị bi na ndida Nigeria na-asụ dịka Igbo, Yoruba, Urobo, Ijo, Edo wdg.
Ndị mba ụwa ndị ọzọ nwekwara asụsụ nke ha na-asụ ha ji e mekọrita n’ime onwe ha.

Asụsụ ọ bụla zuru oke na-enwe ezi nghọta. Asụsụ ụfọdụ ezuchaghị ezu nke mere na ha ga na-anabatarịrị asụsụ mba ọzọ.

Asụsụ ọ bụla na-eme mgbanwe. Asụsụ anaghị akwụ otu ebe. Asụsụ na-anabata ihe mgbanwe dị iche iche dịka okwu ọhụrụ ma ọ bụ ị wepụ ihe ndị e chere na ha adabakwaghị nke ọma otu a choro.

Ihe ọzọ e ji mara asụsụ bụ nwekọrita. Ọ bụ ihe ndị nwe asụsụ kwekọritara na ha ga na-akpọ ihe ụfọdụ ka ha ga na-akpọ ha.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here