Ezinaụlọ na ọdịmma ụwa nile

0
2403
Ezinaụlọ na ọdịmma ụwa nile
Ezeokafor nke St Anthony's Parish Enugwu-Ukwu

Chinwendu Uzoatu

 

EZINAỤLỌ bụ ewumewu nke zuru ụwa nile ọnụ. Ọ bụ nke a mere mba ụwa ji wepụta nwanne ụnyahụ bụ Tuzdee, ọnwa Mee a dị na mkpụrụ ụbọchị iri na ise dịka ụbọchị e jiri cheta ezinaụlọ n’ụwa nile ‘World Family Day’.

Dịka m kwuru na mbụ, ezinaụlọ zuru ụwa nile ọnụ makana ọ bụ na ya ka mmadụ nile si pụta. Onye ọ bụna bụ mmadụ nwere ezinaụlọ o si pụta. Ezinaụlọ nile bụ otu mana nghọta ndị ọcha dị iche na nghọta ndị Igbo n’ihe gbasara ezinaụlọ. Nke a mere na e nwere ụdị ezinaụlọ atọ: ezinaụlọ otu mkpuke, ezinaụlọ ubara mkpuke na ezinaụlọ mgbasa.

Ezinaụlọ otu mkpuke bụ ezinaụlọ ndị mejupụtara ya bụ nke a na-ahụtakari n’obodo ndị ọcha. Nke a pụtara na ọ bụ ụdị ezinaụlọ a ka ndị ọcha na-enwekari. Ezinaụlọ ụbara mkpuke bụ ezinaụlọ nwoke nwe ụlọ na-alụ karịa otu nwanyị. Ezinaụlọ mgbasa bụ nke gụnnyere di, ndị nwunye na ụmụaka, nne di, nna di, ikwunibe ma tinyekwara ndị ọgọ.

 

Ọ bụ ụdị ezinaụlọ a ka ndị Igbo na-enwe. Ezinaụlọ ndị Igbo na-enwe ngalaba, ọ bụ ewumewu nwoke nwere nnukwu ọnọdụ na ndụ ndị Igbo. Ebe ndị ọcha na-eme ezinaụlọ otu nwoke na nwanyị na ụmụ ha, ndị Igbo na eme ezinaụlọ otu nwoke, igwe nwanyị, ụmụ ha na ikwunibe ha. Usoro ndị a nile bụ ezinaụlọ dịka ndị siri nabata.

Ezinaụlọ bụ isi a hụrụ kwaba okpu na ndụ ndị mmadụ maka na onye ọ bụna bụ mmadụ si n’ime ezinaụlọ pụta. Mmekọrita mmadụ na ibe ya na-ebido n’ezinaụlọ.

Ma nne ma nna ma ụmụaka nwere ọlụ dịịrị ha n’ezinaụlọ nke onye ọ bụna n’ime ha ga-arụrịrị nke ya ihe e wee na-aga n’usoro ya.

Ụkoọchukwu Callistus Nwachukwu Ezeokafor nke ‘St Anthony’s Catholic Church’, Enugwu-Ukwu, n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ kọwara ezinaụlọ dịka ewumewu nke Chineke hibere nke nzụkọ doro nsọ. Ọ kọwara na Chineke bụ onye ọ bụ uche ya na ezinaụlọ ga-adị n’ụwa.Ọ rụtụrụ aka n’akwụkwọ nsọ ebe Chineke kwuru na Genesis isi nke abụọ na ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ sọ ya.

Ọ gara n’ihu kwuo na nzukọ na-edo ezinaụlọ nsọ site na di na nwunye ịgba akwụkwọ. O kwuru, ma a mụtara nwa, ma a mụtaghị na ezinaụlọ ka bụkwa ezinaụlọ. O ji ezinaụlọ dị asọ wee nye ihe mgbakwasa ụkwụ dị mma ya bụ ezinaụlọ Jesu, Mary, na Joseph. Ọ kọwara na ma nne, nna na ụmụaka nwere ọlụ dịịrị ha n’ezinaụlọ. Na ọ bụ aka nri kwọọ aka ekpe, aka ekpe a kwọọ aka nri.

Gbasara ajụjụ a jụrụ ya maka ịgba alụkwaghịm, ọ rụtụrụ aka n’akwụkwọ nsọ Mathew, isi nke iri na iteghete. Ọ kọwara na alụmalụ di na nwunye bụ ọkpụkpọ oku na ọ bụghị enyi, tinyere na e nweghị ezi nghọta na-ekewa di na nwunye.
‘Fr’ Ezeokafor gara n’ihu kwuo na ụfọdụ ndị mmadụ na-elegara anya n’ihe a na-ahụ anya ma ha chọba ịlụ di na nwunye, ihe dịka mma na ego, nke a-adịghị adịgide. Ọ rụtụkwara aka na ‘I Peter’, isi nke atọ. O kwuru ka ndị mmadụ chọọ mma nke dị n’ime, nke a naghị ada ada.

N’ikpeazụ, ọ dọrọ nne na nna aka na nti ka ha leruo ụmụ ha anya. Ọ gwara ha na ụwa dị mma bụ na ezinaụlọ dị mma, na ụwa dị njọ bụ na ezinaụlọ dị njọ. Ọ duru ha ọdụ ka ha leruo anya wee rụọ ọlụ Chineke keere ha n’ebe ụmụaka nọ na n’ebe Chineke nọ.

Ọtụtụ ndị mmadụ tinyekwara ọnụ n’okwu kwuru ka ọha na eze nwee ihunanya, ndidi, mụọ mgbaghara ka ezinaụlọ wee bụrụ eji ama atụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here