Ịgụ akwụkwọ na-eweta ngbanwe mmepe – Ndị Ọkammụta

0
840
ndụ ọgụgụ akwụkwọ

Uchenwa Mba

 

NDỊ “National Library of Nigeria’ nọrọ ụnyahụ meee mmemme nke isi okwu ya bụ Ibigide ndụ ọgụgụ akwụkwọ maka ezi mgbanwe ‘Sustaining Life-long Reading for Positive Change’.

 

Mmemme a bụ nke ha ji akwado agụmagụ na uru dị na ya. Ọtụtụ ndị weliere isi n’ọlu gọọmentị bịara na mmemme ahụ gụnyekwara ụmụ akwụkwọ si ebe dị iche iche.

 

Onye Kọmisọna na-ahụ maka nzikọrita ozi bụ C. Don Adinuba biara ma biakwa na ezi oge. Ndị ọzọ biara bụ Sir Chuka Nnabuife, ‘MD/Editor-in-Chief, National Light’, onye nọchịrị anya Joy Ulasi nke ụlọ ọlụ na-ahụ maka ụlọ akwụkwọ sekọndịrị (PPSSC), Dokịnta Ebele Anyaoku nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.

Kọmishọna n’ahụ maka mgbasa ozi bụ onye nọchiri anya gọvanọ na-achị Anambra Steeti bụ Willie Obiano mepere mmemme ahụ n’aha gọvanọ.

Onye nọgodu ka ‘Director, Kenneth Dike Library,’ Nkechi Udeze, gụpụtara akwụkwọ ozị ha ji nabata ndị biara na mmemme ahụ. Ọ sịrị na ihe mmemme ahụ nke na-akwado ịgụ akwụkwọ bụ nọọ nke bara uru nye onye ọ bụla maka na onye ọ bụla na-agụ akwụkwọ bụ onye maara ihe.

N’akwụkwọ ozi ya, ọrịọrọ gọvanọ ka onye ha ala ebe ha ga-ewunye ebe kwesiri ikpọ ‘library’ ka e wee mee ka ndị mmadụ na-abịa ịgụ akwụkwọ na ya. Ọ siri na obi dị ya ụtọ ịhụ mmadụ dịka Dọkịnta Ebele Anyaoku, na mmadụ dịka Ọkammụta Obiora Nwosu bụ onye isi nke mmemme a.

Ọ gara n’iru kwuo na obi dị ya ụtọ n’ọchịchị nke Gọvanọ Willie Obiano n’ihi ezi echiche ya gbasara otu osi ahazi ihe n’akụkụ agụmakwụkwọ nakwa ihe gbasara idozi obibi ndụ ndị mmadụ.
Kọmisọna C. Don Adinuba, n’aha Gọvanọ Willie Obiano kwere nkwa na ya ga enye ndị ‘National Library of Nigeria’ ala dịka ha rịọrọ.

O kwuru na ịgụ akwụkwọ dị mma nke ukwu na ọ na-enyere mmadụ aka ka ọ bụrụ onye a maara aha ya; na ọ na-eme ka mmadụ kwudosie ike na onwe ya. O ji Chinua Achebe maa atụ sị na n’ihi na ọ ma agụ ma na ede n’akwụkwọ maka mba Africa, n’akwụkwọ ya nke ọ kpọrọ ‘Things Fall Apart’ na ndị ọzọ nile welitere aha ya nke ukwu. Ọ sị ka onye ọ bụla makụọ ịgụ akwụkwọ.

Onye isi National Light bụ ‘Sir’ Chuka Nnabuife kwuputara mkpa agụm akwụkwọ dị nye mmadụ nile.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here