Mkpa ọ dị Ị bikọ ọnụ n’udo

0
738

Uchenwa Mba

 

ỤNYAHỤ bụ abali iri na isi nke ọnwa ise n’afọ 2018 (May 16), mba ụwa nile merubere mmemme maka ibikọta ọnụ n’udo,nke a kpọrọ ‘International Day of Living Together in Peace’.

 

Mmemme nke a bụ nọọ iji wee mee ka mba ụwa nile mara mkpa ọ dị mmadụ na ibe ya, obodo na obodo, agbụrụ na agbụrụ, okpukpe na okpukpe mata mkpa ọ dị ibikọta n’otu n’udo.

Na mmemme a, elebara anya na ọtụtụ ụzọ kwesiri ka e si nweta ebumnobi a, ụzọ ọkpụtọrọ ọkpụ a ga-esi na-egbochi agha na asụsụ ụfọdụ na-adị adapụtakari na mba n’agbụrụ dị iche iche. N’ezie, ibikọ n’otu dị mma tinyekwara inwe udo n’etiti ndị ahụ bikọrọ ọnụ n’otu. Ibikọ n’otu ga-eme ndị ọ bụla chọrọ enyem aka e nweta ya ngwa ngwa. Ibikọ n’otu n’udo ga-eme ọ bụrụ na mba ọ bụla e nwee nsogbu dịka ndị nke ọzọ e were obi ọcha gbatara ha ọsọ enyem aka.

Ọ bụrụ na ị leba anya n’ọgbaghara na-adị adakwasị obodo, ma ndị ọcha ma ndị isi ojii, ị ga ahụ ọtụtụ ihe ọjọọ na-adịba na ya.Ha na- atụfu ọtụtụ ndụ na akụ na ụba nke na-eweghachikwa ndị ahụ azụ. A na-etikpọ ụlọ akwụkwọ, kwatuo ụlọ ụka, mebie ụlọ ọlụ nile, kwatukwa ụlọ ahịa, ụlọ mmepụta ngwa ahịa na ụlọ ngwa ọlụ dị iche iche.

Ke mgbe alụchara agha mba ụwa nile ka otu jikọrọ mba ụwa bụ ‘United Nations’ malitere inyere ndị mmadụ aka, ka e wee nwee ndị ga-afọdụ ndụ na mba ụwa. N’ihi na ha hụrụ ihe ọjọọ dị n’agha ahụ, ha wee malite ịchọ usoro ha ga-esi mee nke a ka e wee nwee ibikọ n’otu ka e wee nwee ike imegide ọtụtụ nsogbu dị iche iche nakwa iwulite ọ dị mma ndị mmadụ na inwere onwe mmadụ nile n’ụwa n’agbanyeghị ebe onye si ma ọ bụ asụsụ onye na- asụ na ụka onye nọ na ya.

Ndị otu a nọ n’ọgbakọ ha nwere na ‘December’ 8, 2017, kpebie na ihe mmemme a kwesịrị ka a na eme ya na ‘May’ 16 kwa afọ ọ bụla.

Na ajụjụ ole na ole nke onye ọlụ anyị jụrụ onye ụkọchukwu nke nọ na ‘Christ Ascension Church’, Ifite Awka, aha ya bụ Emmanuel Imo, ọ sịrị n’ezie na mmadụ, mba, agbụrụ ma ọ bụ okpukpere kwesịrị ka ọ bụrụ ihe udo ga-ejupụta na ya maka na ọ bụ udo kachasi mma na ihe nile ọ bụla.

Ọ siri na ọ bụrụ na mba na mba dị n’udo, n’ihe na-agara ha nke ọma; na ha adịghị egbu onwe ha; na ha na-agba mbọ ichekwa ihe ọ bụla jikọrọ ha ọnụ. Ọ sị na ya onwe ya na-akwado mmemme a n’ihi na ọ mara mma nke ukwu. Ọ gara n’ihu sị ka mmadụ ọ bụla ghara ịdị na-eji ọsọsọ ekpebi okwu ọ bụla maka na ọ bụ iji iwe na obi ọkụ na-ebute nsogbu pụta, mmadụ agaghị echetazị na ya na onye nke ọzọ bikọrọ ọnụ ma ọbụ na ya na ya bụ nwanne.

O kwuru sị na akwụkwọ nsọ, ma nke ndị ụka ma nke ndị na-akpọ isi ala akwadoghị igbu mmadụ kama na ọ bụ enweghị udo na ịhụnanya bụ ihe na-akpata nsogbu ha.
Ọ rịọrọ ka mba, agbụrụ,ụka na asụsụ ọbụla mụta ibikọ ọnụ n’udo ka ihe wee gabara mmadụ nile nke ọma.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here