
Chinwendu Uzoatu
ỤLỌ ọlụ ‘Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC)’ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ ‘National Light na Ka Ọ Dị Taa nọrọ nwanne ụnyahụ bụ Tuzdee nwee nnọkọrita mbụ na mbụ nke dị n’etiti ha na onye ndụmọdụ pụrụ iche nye aka na-achị Anambra State ‘ Senior Special Assistant (SSA) to Governor Obianio’ n’ihe gbasara ANPC bụ Oriakụ Fanny Oguine.
Onye isi ụlọ ọlụ a bụ ‘Sir’ Chuka Nnabuife ji obi ańụrị wee nabata Oriakụ Oguine. Ọ buru ụzọ dugharịa ya na ngalaba dị iche iche ma mechaa kpọkọọ ndị ọlụ ka e wee nọkọrita.
N’okwu ya, ‘Sir’ Chuka kwuru ka ndị ọlụ mata na ya bụ agbara nwanyị bụ otu n’ime ha n’ihi na ọ ga na-esonye n’ihe a na-eme oge nile.
Ọ gara n’ihu kwuo na a ga-enwe nkuzi na mgbe n’adighi anya ebe ndị ọlụ ga-anọ wee mụtawanye ụzọ ha ga-esi na’aga n’ihu. Ọ dụkwara ndị ọlụ ọdụ ka ha gara adụ nyara n’ọlụ, ka ọchụrụ onwe ya n’ụgbọ ghara ị sị na ụgbọ eruteghị ya.
O kwuru na akwụkwọ akụkọ a ga-abụ eji ama atụ; na a ga-apị ya bụ mmanụ ma pịta ezi mmanụ. O kwuru na-aga ebubatakwa akụrụngwa dị iche iche ka o wee bụrụ ihe e kwuru ka a na-eme.
Ma onye isi ụlọ ọlụ a ma ndị ọlụ nọ n’ańụrị n’ihi na aka na-achị Anambra Steetị bụ Gov. Willie Obianọ na ebumnobi yam aka ụlọ ọlụ a.
Oriakụ Oguine, n’aka nke ya, gosipụtara afọ ojuju o nwere n’ebe ụlọ ọlụ a nọ ma kelee Chineke maka nke a.
Ọ kọwara ‘Sir’ Chuka Nnabuife dịka onye na-adị ọcha ma na-agbakwa mbọ pụrụ iche n’ime ka ebe nile dị mma nke gosịrị afọ ojuju o nwere n’ọlụ ya, tinyekwara ezi mmekọrịta dị n’etiti ya na ndị ọlụ ya.
O kelere Govanọ Obiano maka ọlụ ọma ya ma dụkwaa ndị ọlụ ọdụ ka ha dị uchu n’ọlụ ha ka ha wee banye na ya bụ ụgbọ na-aga aga.
Onye nọgodụ dịka ‘Editor’ akwụkwọ akụkọ a bụ Oriakụ Rose Oranye bụ onye nyere ekele n’aha ndị ọlụ nile gosịrị obi ańụri ha nwere n’ebe SSA Oriakụ Oguine nọ. O toro ya maka otu o si chọpụta ọlụ na-aga n’ihu ugbu a n’ụlọ ọlụ a.
Ọ gwakwara ndị ọlụ ka ha dịwanye uchu n’ọlụ n’ihi na onye arachaghị ọnụ ya, ụgụrụ a rachaara ya.
N’ikpeazụ, o kwere ya nkwa na ndị ọlụ ga-anwa oko ha; ma tokwa Chineke onye nwe ike nile.