Ọlụ aka bara nnukwu uru na ndụ mmadụ

1
1012
Ọlụ aka
Ọlụ aka

Chinwendu Uzoatu

 

ỌLỤ aka bụ ihe mmadụ na-arụpụta n’onwe ya, nke o ji aka ya arụ. Onye na-arU ọrụ aka na-anọ n’ọrụ mgbe ọ bụna makana ọrụ ya na-abụkari ọrụ ndị mmadụ na-achọ.

E nwere ọrụ aka dị iche iche dịka: ịkwa nka, ịkọ ugbo, isi nri, idozi isi, ido ụlọ, ịkpụ bụlọọkụ, iru kapịnta, ighe akara, ise agidi, ịkwa akwa, wdg. Onye ọ bụna tinyere aka n’ọrụ ndị a na-enweta ego mgbe nile ma were ya na-egbo mkpa diịrị ya.
Ọtụtụ ndị mmadụ esila n’ọrụ aka dị iche iche mepụta ihe ma sorokwa na ndị obodo jiri biri. Ha esina na ya rụọ ụlọ, lụọ nwanyị ma zụlite ụmụ ha n’ogo dị iche iche.

Ọtụtụ ndị mmadụ esikwala n’irụ ọlụ aka wee wulite nnukwu ụlọ ebe a na-emepụta ngwa ahịa dị iche iche. Ụfọdụ sikwa na ya mụbaa site n’iga n’ihu na ngalaba ndị ọzọ dị iche iche.
Otu nwoke malitere ndụ ya site n’ịkwa tụrọkụ. Mgbe o mere nke a afọ ole na ole, ọ malitere zụtba ụgbọala nke ndị mmadụ na-anyara ya wee na-ebu ndị njem. Otu a ka nwoke a si mechaa bụrụ onye a maara aha ya n’ihe gbasara ụgbọala na-ebu ndị njem.

Otu nwokorobia gụchara akwụkwọ na mahadum ma o nweghi ọrụ. o mecha mụọ otu e si eme ncha. Ọ malitere mebe ncha, ndị mmadụ na-egoro ya ruzie na ọ makwaghị ihe o ji ego eme taa. Ọ bụzi nnukwu ọgaranya nke nwere ụlọ na-emepụta ụdị ncha dị iche iche.

N’ikwu eziokwu, ọrụ aka bara nnukwu uru na ndụ mmadụ. Ọ na-agbagwojuzi anya ihe kpatara ọtụtụ ndị mmadụ ji agaghari sị na ha enweghị ọrụ. Mgbe ụfọdụ ka ị ga-ahụ onye ahụ zuru oke, ọ na-arịọ arịrịọ. Kedu ihe a ga-akpọ nke a? Ọ kwa ndị Igbo kwuru okwu sị na onye ngana kpuchie ute, agụụ ekpughee ya. Agụụ abụghị nwanne mmadụ. Nke a mere onye ọ bụla ahụ zuru oke ga-eji chọọ ihe ọ ga-eme.

Nsogbu cheere ọtụtụ ndị mmadụ aka mgba bụ ngana. Ida ngana e meela ka ọtụtụ ndị mmadụ hapụ icho ihe ha ga-eme iji bara onwe ha uru. Ụdị ndị dị otu a, sọọsọ ihe na-agụ ha mgbe nile bụ bute ka e rie. Ihe oriri ọ na-ada n’elu? Ọ bụ ụdị agwa dị otu a na-etinye ọtụtụ n’izu ohi.

Ọtụtụ ụmụokorobịa ka ụgbọala mara mma na-agụ mana ha agaghi arụ ọrụ. Otu ụgbọala mara mma si agụ ha ka ụlọ mara mma si agụ ha. Ụfọdụ atufuola ndụ ha n’ụzọ dị otu a ebe ha gara izu ohi.

Ụfọdụ ụmụnwanyị aghọọla akwụnakwụna ebe ha na-achọ ego n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesi ma hapu ichọ ọrụ aka ha ga-amụ wee si na ya na-enweta ego. Otu nwagbọghọ ka ezigara ebe ọ ga-amụ otu e si akwa akwa. Ka o ruru ebe ahụ, ọ nọrọ ọnwa abụọ gbapụ gbalaa be otu nwoke. Mgbe ọ tụụrụ ime n’aka nwoke ahụ, ọ chụpụrụ ya, ọ wee bụrụ elu eru aka, ala eru aka.

Ọ bụrụ na mmadụ leruo anya ala muta ọlụ aka, ọ ga abara onwe ya uru nke ukwuu. Ọ bụghị sọọsọ na ọ ga na-enweta ego, kama ọ ga-enwetakwa udo nke obi makana ọ ga na-enwe ańụri n’ọlụ nke o ji aka ya wee rụpụta.

Onye ọ bụna nọ n’ọlụ na-enwe ezi echiche makana o nwere ihe ọ na-elegara anya imepụta. Nke a mere na ọ gaghi enwe ohere ị kụ asịrị agaghari n’ogbe. Ihe na-adị ya mkpa n’ụbọchị nile bụ ihe ọ ga-arụpụta n’ụbọchị ahụ.

Ọrụ aka bara nnukwu uru, onye ọ bụna mụtara ya mụtara ezigbo ihe. Ya mere, o kwesiri ka onye enweghị ihe ọ na-eme hie asaa n’anya, makana mmadụ anaghị anọ na mmiri sị na ncha na-aba ya anya.Chetakwa na onye ngana kpuchie ute, agụụ ekpughee ya.

1 ikwu

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here