Ọlụ amalitekwala n’ụzọ na akwà mmiri sịrị Mmịata gaa Anam

0
555
Ọlụ ụzọ na Anambra Steeti

Izunna Okafor

 

ỌLỤ okporo ngó okporo ụzọ na àkwà mmiri ebirikwala ọkụ ọzọ na Mmịata-Anam dị n’okpuru ọchịchị ‘Anambra ‘West” dịka ọchịchị steeti Anambra malitegoro ịbàgide n’àgbà nke abụọ nke ya bụ ọrụ.

Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ọrụ okporo ụzọ, ịchọ ya mma na idozigharị ya, bụ Mazị Marcel Ifejiọfọ mere ka a mara nke a dịka ọ gara n’ebe ahụ iji anya ya wee hụ ka ihe si aga. O kwuru na ọrụ ngo ahụ dị àgbà abụọ, kọwaa na kilomita ise n’ime ụzọ ahụ dị kilomita iri bụ nke a rụchapụgoro, ma meekwa ka a mara na a rụchapụla ihe karịrị pasentị iri na asaa nke ọrụ ngo ahụ, ọ bụnadị dịka o kwuru na ọrụ ga-akụrụ ọnụ ebe ahụ oge adịghị anya.

Ọ kpọkuru ma rịọ ụmụafọ obodo ahụ ndị ọrụ ahụ metụtara n’ụzọ dị iche iche ka ha kwụsị ịnagharị ma ọ bụ ịdọghachi ọrụ ahụ azụ, ma kwe nkwa ịña ntị na ilebà anya na mkpesa nile ha wetara nakwa ime ihe ha nwere ike ime, iji hụ na obi dị oke na ngwere mma.

N’okwu nke ya, onyeisi ụlọ ọrụ “Kanubeen Construction Company Ltd.” ji ọrụ ngo ahụ, bụ Mazị Bechara Karan, kwere nkwa na ha ga-ewelitekwu aka n’oge ma hụ na a rụchapụrụ ọrụ ahụ ngwa ngwa tupu ma ọ bụ oge e kwekọrịtara na ọ ga-akụrụ ọnụ. Ọ kọwara mgbochi na nsogbu ahụ ndị obodo ahụ na-enye ha n’ịrụ ọrụ ahụ dịka ihe kacha ebi ha aka ọjọọ, ma na-adọghachikwa aka elekere azụ n’ ọrụ ahụ.

Ọ kpọkukwazịrị ọchịchị steeti Anambra ka ọ zọbanye ụkwụ ma lebara nke ahụ anya ka ya bụ ọrụ wee gaa siriri wee ruo mgbe e sepuru aka na ya.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ụlọ ọrụ ”Anambra Project Monitoring & Management Office (APMMO)”, Mazị Mike Obuekwe, bụ onye soro wee bịa ilete ka ya bụ ọrụ si aga kwuru n’ụzọ ahụ ga-eweta ezi mmepe n’obodo ahụ, ma nyekwa aka kwalite ịkọ ugbo na ibuputa ihe a kọtara n’ugbo n’okpuru ọchịchị ahụ nile.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here