Otu ahụike abịla lee ndị ANPC ahụ

0
758
Ndi olu ANPC
Onye isi ụlọ ọlụ ANPC, Chuka Nnabuife (nke ise n'aka nri), onye n'alụgọdụ ọlụ ka 'Editor' National Light na Ka Ọ Dị Taa, Rose Oranye (nke atọ n'aka ekpe) na ụfọdụ ndị ọlụ ha ka-agbasara ụka ịtụ mmamma ahụ.

Chinwendu Uzoatu

 

OTU ahụike a kpọrọ ‘Smithonian Value Resources (SVR) bịara njem maka ahụike n’ụlọ ọlụ Anambra Newspapers and Printing Coorporation, ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light na Ka Ọ Dị Taa.

Onye isi ANPC bụ ‘Sir’ Chuka Nnabuife nabatara ha nke ọma ma gwa ndị ọlụ ka ha gee ha ntị n’olu ma ritekwa elele n’ihe ha bịara n’ihi na a ghara ndụ kpaa akụ, onye iro erie.
Otu onye n’ime ndị otu a nke si na ngalaba ‘Health Research and Development’ bụ Stephen Nwanya kọwara ọtụtụ ihe gbasara ahụike.

O nyere ndụmọdụ banyere ụzọ mmadụ ga-esi wee nyere onwe ya aka. Ọ kọwara na mmadụ kwesịrị izu ike opekata mpe awa asatọ n’ụbọchị.

Ọ gara n’ihu kwuo na mmadụ kwesịrị ị na-emegharị ahụ ‘exercise’ iji nyere ndụ ya aka. Ọ kọwara na ọsịsọọ kwesịrị ịdị na-agbapụ n’ahụ mamdụ, ọ kachasị bido n’elekere nke ise ruo elekere nke asatọ n’ụtụtụ na abalị.

Ọ gụsitaara ndị ọlụ usoro kacha mma iji rie nri. Ọ gwara ha ka ha wetuo aka n’iri ji, akpụ, garị na ọtụtụ nri ndị ọzọ na-amụba suga n’ime ahụ mmadụ.

O kwuru na mmadụ ekwesịghị ịna erikọta nri na mkpụrụ osisi n’otu oge. O kwuru na nke ahụ adịghị mma, na o kwesiri ka e rie mkpụrụosisi mgbe mmadụ richara nri, ọ kachasi n’abali.

O kwuru na akwụkwọ nri na mkpụrụosisi bara uru na ndụ mmadụ, ma kwukwa ka a hapụ ị na-ańụ mmiri ma a na-eri nri.
Mazị Nwanya gakwara n’ihu dụọ ndị mmadụ ọdụ ka ha kpachara anya n’iri ihe ndị e si mba ofesi bụbata n’ala anyị. Dịka o kwuru, ụfọdụ n’ime ha nwere ihe ndị agbanyechara n’ime ha nke e ji chekwaa ha maka imebi ọsọ ọsọ nke na-adịchaghị mma n’ahụ mmadụ.

Ọ kwukwara na ọ ka mma mmadụ iri osikapa nke a kọrọ n’ala anyị karịa ndị e si mba ofesi wee bubata. Ndị ọlụ jụrụ ya ajụjụ dị iche iche nke ojiri nwayọ wee zaa.
N’ikpeazu, igwe ndị ahụike a lelere ndị ọlụ dị iche iche ahụ ma kụziere ha ihe ha kwesịrị ime.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here