Onye isi ụka apịagbuola onye ọrịa ọ na-ekpere ekpere

0
665
ọchụ

Chinwendu Uzoatu

 

AKA ndị uweoji ‘Delta State Command’ anwụchikọọna otu onye isi ụka bụ onye nke e kwuru na o tigburu onye ọrịa a hanyere ya n’aka ka o kpeere ekpere.

‘Prophet’ Moses Urovbu, bụ ‘General Overseer, God Revival Prayer Ministry’, Ugheli, bụ onye nke a kpọtaara otu nwoke gbara afọ iri atọ aha ya bụ Monday Edjedjere, bụ onye e kwuru na ọ nwere nsogbu isi mgbaka, e jirila ụtali pịagbuo ya.

Ọ bụ nne Monday kpọtara ya n’ụlọ ekpere ahụ ma hanye ya onye isi ekpere n’aka wee laghachi na be ya bụ Awsha. ‘Prophet’ Moses tinyere Monday n’ibu ọnụ ‘dry fast’ abali asaa, were ‘chain’kedo ya n’ukwu osisi akụbekee dị n’azụ ụloekpere ahụ ma werekwa ụtali mmiri nsọ ‘holy water cane’ na-apia ya kwa mgbe kwa mgbe ganye n’ike agwụ ya, o wee nwụọ.

Nne Monday bụ nwoke nwụrụ anwụ, kwuru na oge ọ chọpụtara na o kenyere nwa ya n’ukwu akụbekee, na ọ rịọrịọ ya ka ọ kpọnye ya nwa ya ka ha laba ma ọ jụrụ ajụ ma kwuo na ọ na-agwọ ọrịa ahụ.
Ka o sila dị, onye isi ụlọekpere ahụ bụ ‘Prophet’ Urovbu, n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ kwuru si; ‘a bụ m onye isi ‘General Overseer of God Revival Prayer Ministry’. E bidoro m nke a n’afọ 1989, ma nwekwa imirikiti ndị ụka m. Enwere m ngalaba anọ ndị dị na Warri, Ughelim, Ewu na Bayelsa Steeti.

“Ana m ekpere ọtụtụ ndị ọrịa ekpere n’ụlọ ụka m. Ọ bụ nne onye a nwụrụ anwụ kpọtara ya n’ụlọ ụka m makana o nwere nsogbu isi mgbaka. Anabatara m ha ma gwa ya ego ole ha ga-akwụ m. “Agwara ya (nne ya) ka ọ kwụọ puku naira iri abụọ na anọ (N24,000) mana ọ jisiri ike kwụọ puku naira asatọ (N8,000).”

GUO:  Na Germany, nwoke agbagbuola nne, nna na ikwu ya mmadụ anọ, merụọ abụọ ahụ

Prophet Moses Urovbu gara n’ihu kwuo na o nyere Monday ebumọnụ abalị asaa, na ọ bụ mgbe o bidoro mebe isi ike, mebiwe oche rọba nke ụlọ ekpere ahụ ka ọ bidoro pịawa ya ụtalị mmiri nsọ.

Mgbe nne ya hụrụ na-emerụsiri nwa ya ahụ, ọ rịọrọ ya ka ọ kpọrọ ya laa ma ọ jụrụ ajụ. Onye isi ụka a kwuru na Monday mechara ike gwụ ya, ọ daa wee bụrụ onye nwụrụ anwụ. O gakwara n’ihu kwuo na ụbọchị ọdachị ahụ dapụtara, na ọ dị mmadụ ise bụ ndị ọ gwọrọ ọrịa bụ ndị ọ zilara be ha n’ụbọchị ahụ.

Nwanne nwoke Monday (bụ onye nwụrụ anwụ), Michael Edjedjere bụ onye kpọbatara ndị uweoji n’okwu a kwuru na ọ rịọrọ onye isi ụka ahụ ka ọ kpọrọ nwanne ya laa ma ọ jụrụ ajụ. Mgbe abalị abụọ gara, nne ha kpọrọ ya ma gwa ya na nwanne ya nwoke Monday anwụọla.

Nke a mere na ya gara kpesara ndị uweoji ozigbo. Ka o sila dị, ozi si n’aka ndị uweojii ‘Delta State Command’ gosiri na ha anwụchikọọna ya bụ onye isi ụka.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here