Irubere iwu isi dị mkpa

0
745
Irubere iwu isi

Victor Maduagwuna

 

NRUBEISI na ndebeiwu bụ ụgbọ eji aga mba, bụrụkwa ihe kachasị mkpa na ndụ ndị mmadụ. Nrubeisi bụ mmadụ iji obi umeala, obi ọcha na obi na agbagọghị agbagọ were na-aga ozi e ziri ya, ma ọ bụ ozi o kwesiri ije na-echeghị ka e zikwa ya ọzọ. N’aka nke ọzọ, ndebeiwu bụ mmadụ ime ihe iwu kwuru dịka o siri kwuo ka e mee ya, ọ bụ irube isi nye iwu ahụ gọọmentị ma ọ bụ obodo tiri.

Iwu bụ mmadụ n’eti iwu. Ọ bụkwa ụzọ mmadụ na gọọmentị ji achịkwa agamnihu na ịdị n’otu n’obodo nile nke dị na Nigeria ma ọ bụ n’ụwa nile gburugburu.

Oge ọ bụla ndị mmadụ ma ọ bụ obodo jikọtara onwe ha iji mezuo etu ebumnuche ha siri dị, ha abụrụla otu. Ha kwesiri inwe iwu, atụmatụ na usoro ha ga-agbaso iji hụ na ha na-emezu ebumnobi ha. Onye ọ bụla nọkwa n’obodo ahụ kwesiri idebe iwu ndị ahụ na-achị obodo ahụ. Ọ bụzi idebezu iwu ahụ na-achị obodo ma na-erube isi na ụlọ ọlụ ma ọ bụ ebe ndị ọzọ dị iche iche ka e ji ama ezi mmadụ.

 

Ọ bụ ihe ịtụnanya na Nigeria ugbua, na ndị mmadụ dị iche iche jizi imebi iwu mere aka ọlụ, nke mere na ihe ọjọọ jupụtara na obodo. Ịgbụ mmadụ, nke bụ alụ mgbe ochie bụkwazị ihe na-eme oge nile ugbua. Izu ohi, ịtọ mmadụ na ihe ọjọọ ndị ọzọ abụghịzị ihe ịtunanya. Ya mere n’okwesịrị ka mmadụ ọ bụla na-edebe iwu na obodo Nigeria ka ọ wee dịrị anyị mma.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here