Ndị na-achị ehi egbuola mmadụ asaa na Benue

0
678

Chinwendu Uzoatu

 

OPEKATA mpe, mmadụ asaa ọzọ anwụọla pịị oge ndị oji egbe, bụ ndị nke e chere na ha bụ ndị na-achị ehi wakporo ha n’obodo Tseadough bụ ogbe dị na Mbachom, Yaav n’okpuru ọchịchị Kwande nke dị na Steeti Benue.

 

Ndị a wakporo ha ka e kwuru na ha merụrụ mmadụ isii ndị ọzọ ahụ ma kpụrụ otu nwanyị laa. Ha gbakwara ọtụtụ ụlọ ọkụ n’okirikiri ahụ.

 

Ozi e si n’aka onye isi oche okpuru ọchịchị Kwande bụ Terdoo Nyor Kenti na-akọwa na ndị oji egbe ahụ wakporo obodo ahụ n’etiti ndeeri ‘midnight’ oge mmadụ nile dị n’ụra ma bido gbawa egbe n’ike n’ike n’okirikiri nile.

O kwuru si, ‘Ha gburu mmadụ asaa ma merụọ mmadụ isii ahụ ebe ha bụ ndị na-achị ehi kpụrụkwara otu nwanyị laa, ka ha gbachara ọtụtụ ụlọ ọkụ n’okirikiri ahụ.

 

Ndị nta akụkọ chọpụtara na mkpamkpa a mere ka ọtụtụ obodo dị iche iche na mpaghara ahụ malitere na-agba ọsọ ndụ ha n’ihi egwu ndị ogbu ọchụ ahụ.

Onye isi oche kansụl ahụ, onye nke kwuru na ọdịghị nsogbu ọbụna nke dịbu n’etiti ndị obodo ahụ na ndị Fulani na-achị ehi, kọwara na nke a gbara ya gharịị otu ndị ahụ bụ ndị oji egbe si wakpo ndị nke ya n’enweghị okwu ọbụna.

 

Mbọ nile ndị nta akụkọ gbara iji nweta ‘State Police Command’ mara afọ n’ala.

GUO:  Ochanya Ogbanje: Ọnwụ obere nwata nwaanyị a e metọrọ bunye ọya akpasuela ndị Benue iwe

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here