Ndị Nteje akwaa nwanyị ndị na-achị ehi gburu

0
1447

Izunna Okafor

 

Ọ BỤ nnọọ oge anya mmiri na Nteje dị n’okpuru ọchịchị Oyi na steeti Anambra, dịka ndị obodo ahụ zukọrọ n’ụjụ wee lie ma mee mmemme akwamozu Oriakụ Rosemary Okwuefuna, bụ onye ndị na-achị ehi gburu n’ebe ọ na-akọrọ onwe ya ugbo na Nteje.

 

Oriakụ Okwuefuna, onye gbara afọ iri atọ na asatọ, ka a kọwara na ọ pụrụ n’abalị atọ nke ọnwa ‘April’ afọ a gaba n’ugbo ya dị n’Agụ Ụmụnebo, Nteje, bụzị ebe ndị na-achị ehi wakporo ya, kee ya agbụ, kwaso ya iko n’ike ma gbuo ya.

 

Na nkenke okwuchukwu ya n’ofufe nru akwamozu ahụ, nke weere ọnọdụ n’ụlọ ụka ‘Sacred Heart Parish’, Nteje, onye ụkọchukwu Peter Okolo kwuru na ebumnobi Chineke jiri kee mmadụ bụ ka o wee mara ya, hụ ya n’anya, ma kpeere ya ruo ebighị ebi; ma kwazie arịrị na ụmụ mmadụ ekweghị ewere onwe ha nyefee Chineke n’aka, ọbụnadị dịka o kwuru na ọ bụ ka onye siri bie ndụ ya ga-akọwa ebe ọ ga-aga n’ụbọchị ikpe azụ.

 

Ọ kwara arịrị na ndị na-achị ehi emeela ọtụtụ ụmụ mmadụ ihe obi mgbawa na mpaghara dị iche iche n’ala anyị, ma kpọkuo onyeisi ala bụ Muhammadụ Buharị ka o bilie ugbu a ma mee ihe a na-atụ anya n’aka ya, iji gbochie ọnọdụ ọjọọ ahụ.

N’okwu nke ya, eze ọdịnala Nteje, Igwe Rowland Odegbo, kwara arịrị banyere ihe egwu ahụ dakwasịrị obodo ahụ nakwa otu ndị Fụlani na-achị ehi si egbusi mmadụ n’ala anyị, ma kọwaa na Gọvanọ Obianọ eguzobela otu ga-elèba anya banyere ọnọdụ ọjọọ ahụ, ma bụrụkwa ndị gbara mbọ pụrụ iche iji hazie akwamozu ahụ.

GUO:  Onye Fulani ọ bụla na-achi ehi bu egbe, kpụpụ ya ụlọ ikpe – Buhari

 

Ọ dụrụ ụmụnwanyị obodo ahụ ka ha na-eso n’ìgwè wee na-aga n’ubi, ma kpọkuo ndị gọọmenti na ndị aka ji akụ ka ha nye aka n’ịzụ ụmụ ise nke nwanyị ahụ nwụrụ anwụ hapụrụ wee laa mmụọ.
Onyeisi “Nteje Development Union” bụ chiifu Benneth Nweze, kọwara ndị Nteje dịka ndị na-akọ ugbo nke ukwu, ma kwaa arịrị nke ukwu na ọnọdụ ọjọọ ahụ etinyela ụjọ n’obi onye ọbụla.
N’akụkụ nke ya, nwanne nwanyị onye ahụ nwụrụ anwụ, bụ Benedeth Mmadụka kwuru na nwanne ya nwanyị ruru ụjụ ọnwụ di ya nso nso a, nke a wee dakwasịkwa ya; ma kpọkuo gọọmenti ka o mee nnyocha pụrụ iche iji nwụchikọọ ndị rụrụ ala ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here