Ndị ụka etoola Fada Stephen Echezona maka ndu ọma ya

0
946

Chinwendu Uzoatu

 

EBE nile bụ egwu na amụ ụbọchị ụka gara aga na ‘St Gabriel’s Catholic Church’, Okpuno, n’okpuro ọchịchị Awka ‘North’. Ọ bụ ubọchị ahụ ka ha meere onye ụkọchukwu nke lụburu ọlụ na ya bụ ụlọụka emume gaa n’udo (‘sent forth).’

 

Ụkọchukwu a bụ ‘Rev Fr’ Stephen Echezeona, onye nke na-alụzi ọlụ ugbu a na ‘St Peter’s Parish’, Oko, n’Orumba ‘North’.

‘Fr’. Echezona bụ ‘Vicar’ izizi lụlụ ọlụ na ‘St Gabriel’, Okpuno. Ebe ahụ bụkwa ebe izizi ọlụlụ ọlụ ka e chichara ya ụkọchukwu.

E ji aja maasị wee malite mmemme a, nke ọ bụ ‘Fr’ Stephen Echezona n’onwe ya nọ n’isi emume.
A nọ n’aja maasị a kpee ekpere ma too Chineke n’ebe ọ dị ukwu, ma bụọrọ ya abụ otito.

 

Ndị ‘parish’ kansụl gụpụtara ozi ekele ha site kelee ‘Fr’. Echezona maka ọlụọma ya ma tokwaa Chineke n’ịsị ya. Ka e mechara, otu dị iche iche kwụrụ n’ahịrị n’ahịrị wee na-ekele ya ma na-enyekwa ya ihe onyinye dị iche iche. ‘Fr’ Echezona ji aṅụrị na-anabata ha ma na-agọzikwa ha.
O kelere Chineke n’ịsi mmmadụ nile ma kwuo n’ọnụnọ ọ nọrọ na ‘St Gabriel’, Ọkpụnọ bụ ịhe inye chineke ekene.

 

N’okwu nke ya, Ụkọchukwu bụ onye isi parish ‘St Gabriel’, Okpuno bụ ‘Rev Fr’. Anthony Nwankwo kọwara Fr. Echezona dịka onye na-atu nkọ ma kwukwa na ọ dị umeala ma na-erubekwa isi. Ọ gara n’ihu kwuo na muonso ji ya kwara ngwa ọlụ.

 

‘Rev Fr’. John Oraemesi kọwara Fr. Echezona dịka onye nwere nsọpụrụ n’ebe ndị isi ya nọ ma kwukwa na ọ dị uchu n’ọlụ.

Ụkọchukwu nọchiziri anya Fr. Echezona dịka ‘Vicar’ na ‘St Gabriel’, Okpuno, toro ya maka ọlụ ọma ya ma rịọkwaa amara Chineke maka ịgbaso nzọ ụkwụ ya.

Onye nkuzi ụka, Mazị Charles Nwuba kwukwara okwu ọma n’isi Fr. Echezona. Otu onye ukwe bụ Elizabeth Ilonwa kọwara ya dịka egbe ọkụ (‘matches’) n’ihi na o kwuru na ọ na-enwu ọkụ vam ka egbe ọkụ.

 

Mmadụ dịka Oriaku Lucy Okere na ọtụtụ ndị ọzọ gụnyere ụmụaka, ndị ntorobịa na ndị nne na nna toro Chineke maka Fr. Echezona .
N’ikpeazu, ụmụaka ‘Little Angels’ bụụrụ ya abụ iji si ya gaa ebe ọ na-aga n’udo ma gbakwara ya egwu.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here