Obianọ abàgide n’itute amụma ịgba mmiri n’ubi

0
589
Asusu Igbo

Izunna Okafor

 

AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ abagidela itute atụmatụ iji igwè gbaa mmiri n’ubi, iji mee ka amụma ọlụ ugbo na-agawanye n’ihu na steeti ahụ, ma n’udu mmiri ma n’ọkọchị.

 

Gọvanọ Obianọ kwuru nke a oge ọ gara ileta ebe ahụ e nwere nnukwu igwè e ji agba mmiri n’ubi, nke dị n’Ifite Ọgwarị n’okpuru ọchịchị Ayamelụm dị na steeti ahụ.

Ka ọ gachara okirikiri, lechaa ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n’ebe ahụ, ọ kwuputara ezi mmasị o nwere na njikere ọchịchị ya dị n’itute ebe ahụ ka ọ lụbakwa ọlụ nke ọma, ma kwuo na nke ahụ ga-enyezị aka ịhụ na a na-akọpụta osikapa gbaa nyụụ, site n’afọ ruo n’afọ n’okpuru ọchịchị ahụ.

 

Igwè mmiri ahụ bụ nke a rụchara n’afọ 1987, ma bụrụkwa nke bịara site n’aka onyeisi ala Ibrahim Babangida n’oge ọchịchị ndị agha, ebe otu ụlọ ọlụ mba Japan bụ ndị na-elekọtabụ ya anya oge ahụ, wee rukwaa mgbe a gbahapụrụ ya kemgbe ihe dịka afọ iri na asaa gara aga n’ihi ọgba aghara dapụtara.

 

N’otu aka ahụ, Gọvanọ Obianọ kwuputakwara afọ ojuju ya na obi ụtọ ya banyere otu agba nke mbụ nke amụma “Agricultural Transformation Agenda Support Program” (ATASP) siri nwee mmasị n’ọlụ ngo ahụ, ma kwuo na ha na ndị steeti ahụ ga-ezùte na mgbe adịghị anya iji wee kpaa ụbụbọ maka nke ahụ.

 

Na ntụnye nke ya, onye nhazi amụmà “Lower Anambra Irrigation Project” bụ Mazị Eric Ejeagbụcha kwuru na igwè ahụ nwere ikike ịfụsà mmiri wee ruo ihe dịka Kilomita iri na isii, ma kesàá mmiri n’obosara ala ruru hekta puku atọ na narị asatọ.

GUO:  Obianọ ariọ ezi mmekọrịta n'etiti ndị okwukwe dị iche iche

 

Onye nchịkọta “Agricultural Transformation Agenda Support Program” (ATASP) na mpaghara ahụ, bụ Mazị Romanus Egba, n’aka nke ya, kwuru na ha arụnyela igwè nkesà mmiri dị iche iche na mpaghara ahụ iji nye ebe nkọpụta osikapa dị n’Ọmọr, ma kwuo na ha ga-alụnyekwu ọtụtụ ma ọ bụrụ na e binye aka n’amụmà ego ọlụ ala anyị nke afọ 2018.

 

N’ozi ekele ya, onyeisi oche nchere oge n’okpuru ọchchị ahụ, bụ Mazị Ken Okolo toro Gọvanọ Obianọ maka ezi nzọpụ ụkwụ ahụ, ma kpọkuokwa onye ọbụla ka ọ dọnyere gọọmenti steeti ahụ ukwù n’ihi mbọ pụrụ iche ọ na-agba n’iji debe steeti ahụ n’ogogo mba ụwa.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here