ụwa emeela mmemme idebe obodo ocha

0
1313
idebe obodo ocha

Uchenwa Mba

 

GBURUGBURU anyị kwesiri ka a kpachapụrụ ya anya nke ọma ka o wee bụrụ ebe mmadụ na ụmụanụmanụ ga-ebi n’ọṅụ na obi ụtọ maka na ọ bụrụ na gburugburu anyị adịghị mma, mmadụ na ihe nile bi na ime ya agaghị enwe ọṅụ. Ọzọ, ọ bụrụ na gburugburu anyị adịghị ọcha, ahụ agaghị adị mmadụ mma.

 

N’oge agha, ihe na-eweta ọrịa ọjọọ dị iche iche, agụụ na ọnwụ bụ nsogbụ dị na gburugburu anyị.Ụmụanụmanụ nile na-enwekwa nsogbu ma ọ bụrụ na ngwa agha ọjọọ a na-agbanye na ikuku eweta nsogbu na gburugburu anyị.

Gburugburu anyị kwesiri ka elebara ya anya site na ịgbochi ihe ọ bụla ga-eme ka e nwee nsogbu. Ọ bụghị nanị nsogbu agha, agụụ, ọrịa, ọnwụ na nsogbu nke na-adị adapụta na mberede dịka mmiri ịbukọrọ ihe ma ọ bụ ụlọ ndị mmadụ.Ilebara gburugburu anyị anya gụnyere ịkụ osisi ndị ga na-egbochi ide mmiri. Ọzọkwa bụ iwa ezi owara mmiri. Ihe ndị a ga-enye aka ime ka gburugburu anyị dị mma bụrụ ebe kwesiri ihe nile na eku ume ndu ịnọ.

 

N’abalị abụọ gara aga, ndị mba ụwa mere mmemme iji cheta otu a ga-esi na elebara gburugburu anyị anya. Mmemme a bụ nọọ nke a na eme kwa afọ ọ bụla ke mgbe e bidoro ya. Mmemme a bụ iji mee ka mmadụ nile mara mkpa ọ dị ime ka gburugburu anyị dị mma ma dịkwa n’udo.

 

Ndị chikọbara otu a bụ ndị ‘United Nations,’ o wee gbasaa gazue mba ụwa nile taa. Ebe ha ji mere isi ọnọdụ ha bụ Nairobi, Kenya. Mgbe ha bidoro ọgbakọ a bụ n’afọ 1972. Ọ bụkwa n’abali ise nke ọnwa isii afọ ọ bụla ka ha wepụtara ka a na emerube mmemme a (June 5). Ụbọchị dị otu a bụ ụbọchị ha wepụtara ka e were na elebara gburugburu anyị anya mana akpakwa otu ọ ga-esi makaria mma.

 

Ọnụ ọgụgụ mba ụwa na esonye na imerube mmemme a kariri ihe dịka nari abụọ na ọgụ iri. Ọ bụkwa ụbọchị ndị ọchịchị na ndị nkiti ji eme ka amara ọtụtụ ihe dị na gburugburu ha. Ebe a na-anọ emekarị mmemme a na-abụkari n’ụlọakwụkwọ. Ndị nkuzi na a hazi ọtụtụ ihe ọmụmụ ha na-enye ụmụ akwụkwọ n’ụbọchị ahụ dịka ndị a; ịde leta, ịgụ ihe ọgụgụ, nkwupụta okwu otu okwesiri ma mmadụ nọrọ na ọgbọ, ịkparịta ụka nakwa ịgosi ihe onyonyoo nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị iche iche.

 

Ebumnobi eji hibe mmemme a bụ iji mee ka ọtụtụ nsogbụ na-adị adapụta na gburugburu bụrụ ihe elebara anya nke ọma. Ihe ọzọ dị oke mkpa na mmemme a bụ na ọ bụ oge e ji eme ka mba ụwa nile mara mkpa udo na oganiru ịdị na gburugburu anyị pụtara. Ọ bụkwa oge e ji eme ka ndị mmadụ mara uru dị na inwe ezi mmekọrita na gburugburu anyị.

 

Ihe nkuzi a na-enye n’oge mmemme a na-enye aka ime ka onye ọ bụla ghọta ma mara otu a ga-esi mee ka a na-eme ezi nchekwa nye mba ụwa nile na mmadụ bị na ime ya.
Kwa afọ ọ bụla, a na-enwe isi okwu, ọ bụkwa mba ndị ga-achịkọba ya n’afọ ọ bụla na-ewepụta isi okwu ha chọrọ ka elebara anya.

 

Ndị India chịkọbara mmemme a n’afọ a wepụtara isi okwu nke ha kpọrọ ‘Plastic Pollution’ dịka ihe ha chọrọ ka elebara anya . Ha sịrị na ọ bụ ihe dị mkpa ime ka ọgbọ na-abịa abịa mara ihe bụ ọlụ ha nakwa otu ha ga-esi mee ya. Ha sịrị na okwesiri ka ha mara na ha pụrụ iji aka ha n’uche ha mee gburugburu ha ka ọ bụrụ ebe dị mma nke ukwu. Ọzọkwa, na ha ekwesịghị iso ụfọdụ ụzọ nke ndị ugbua soro bụ nke mere na a na-enwe nsogbu na gburugburu anyị taa.

 

Erik Soiheim, bụ onye isi nke ‘UN Environment’ sịrị na dịka ha enweghị ike ịgazu ebe nile n’onwe ha, ma ọ bụ gakwuru onye ọ bụla n’otu n’otu, na ebe akpọrọ ‘Bottle Island’ bụ ihe ga-egosi onye ọ bụla ụdị nsogbu ma ọ bụ ụfọdụ ihe ịma aka na iru dị na gburugburu anyị taa.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here