Winnie Mandela bụ odogwu nwanyị – ‘NLC’

0
781
Winnie Mandela
Winnie Mandela

OTU’ Nigerian Labour Congress (NLC)’ akọwaala ọnwụ Winnie Madikizela Mandela bụ onye so n’onye mbụ gbara mbọ maka nwere onwe nke South Africa dịka ndụ nke jupụtara n’ịgba mbọ.

Onye isi oche NLC, Ayuba Wabba, kwuru na ndị otu ha na Nigeria e sonyerela ndị ọdịka ọ dị ha na mba ụwa n’iru uju ọnwụ odogwu nwanyị Africa a.

 

O kwuru si ‘ọ bụ eziokwu na ọnwụ Winnie wutere anyị, otu’Nigerian Labour Movement’ nwekwara ihe anyi ga-eji too ndụ ya nke jupụtara n’ịgba mbọ, ịchụ aja na ịgbara ndị mmadụ odibo, dịka o si dị na ndụ Mama Winnie.’

Winnie Mandela bụ onye nwụrụ ka ọnwa ‘April’ dị na mkpụrụ ụbọchị abụọ. Wabba gara n’ihu kwuo, ‘ka ọtụtụ ndị mmadụ, nde kwuru nde si nọrọ na nwute na South Africa, mba ụwa dị iche iche gosipụtara ezi mbọ nke onye ahụ ndị South Africa ji ihunanya na-akpọ ‘Mama’.

Ọ gakwara n’ihi kwuo na ọ hịara ahụ ịkọwapụtacha ọlụ ọma, ịchụ aja nke Winnie Mandela maka ịgbapụta mba ahụ. Ọ kọwakwara na Winnie Mandela gbara mbọ pụrụ iche ma dịkwa egwu dịka onye hụrụ ndị nke ya n’anya, ịgba mbọ mnwere onwe; tinyekwara ọ dị mma nke mmadụ nile.

 

N’afọ nile nke Nelson Mandela na ndị ndu nke ‘African National Congress’ nọ na mkpọrọ, ma ndị nke a chụpụrụ achụpụ, Winnie Mandela nọgidesiri ike na-agba mbọ maka ọdị mma ndị nke ya.
A tara ya ahụhụ, tie ya ihe, tụọ ya nga ma napụkwa ya ọtụtụ ihe ruuru ya ma ọ nọgidesiri ike n’idu ndị nke ya, nke a bụ ka o wee zọpụta nde kwuru nde ndị South Africa.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here