Abụ dị iche iche maka Naịjirịa

0
1064
Nwanyị Loro Akwa Eke
Akụkọ Ifo

Alaeze Awuufu

Pita Ejiọfọ

 

N’ỌDIMMA ọha na eze ma ijiala n’obodo,
Ka njọ awuufu na-apụtakarịcha ife.
E jide onye riri nde kwuru nde awuufu,
Ndị uwe añụrịa, nara ya awuufu nke ha, rigodu.

 

Kpụga ya n’ụlọikpe, kụọrụ obodo ekwe,
Ma kpachara anya, detọkọọ ihe o mere.
Ndị ọkaiwu agbaa onye ahụ gburugburu,
O selụ enu ego awuufu, wee goru ha dum.

 

Ọkaikpe ụlọikpe ụfọdụ a kpụtaara ya,
Ańụrịa, nabirikwa ya awuufu ahụ, rie nke ya.
Tuọ onye riri awuufu nde kwuru nde naịra nga,
Naanị otu ọnwa ọ ga-anọ, na-arụọrụike.

 

Ndị nche nga añụrịa, narakwa awuufu nke ha,
Nye ya ụlọ ntụoyi, lezienụ “ọrụike” ahụ,
Kwa ọtụtụ, ọọñụọ tii, rie umeju anụ, taa akwa,
Anyasị, a sụọrụ ya nri ji, o rie, hie ụra miri emi.

 

Ọpụtazịa, o dochaa ahụ ka agbọghọ na-aga di,
Igwe mmadụ enuputa, were egwu chere ya,
Jiri igbenduru, ijere na oriri, wee nabata ya,
Ndị “Patii” ya ekwuo, na aka ya dịburịị ọcha.

 

O zuchaa ike, o bido metụwa ego awuufu aka,
Mekasịwa okpogho na “lọnchim” kwuru lọnchịm,
N’ime otu afọ, e chiela ya nze na ọzọ, chif na ichie,
Ngwa, kwuwekwanụ okwu, na Naịjirịa ka a nọ!

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here