Ajadu ọbụna ga-eke ajị n’ume

0
707

Chinwendu Uzoatu

 

MBA ụwa ewepụtana ụbọchị Satọdee na-abịa abịa, ọnwa a bụ ọnwa June ga-adị na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na atọ dịka ụbọchị ndị ajadu, bekee kpọrọ ‘International Widows Day’.

 

Nke a pụtara na nwanyị ọbụna di ya nwụrụ anwụ aghọọna ajadu, ma nwata ma agadi.
N’oge gboo, ọtụtụ ndị ajadu tara ahụhụ dị iche iche n’aka ndị be di ha. Ụfọdụ ka a naara ihe ha n’ike dịka ala, ụlọ na ihe nketa dị iche iche. O nwekwara ndị e gburu egbu. N’oge ahụ, ajadu na-adị ka ọ bụ onye a bụrụ ọnụ, onye ụwa jụrụ ajụ.

Ọtụtụ ndị ajadu bụ ndị ụmụnwoke jiri aka ike na-esogbu ha ma na-akwa ha iko na mmegide n’ihi na ha enweghị ọnụ okwu. Nke a mere ka ọtụtụ ndị ajadu mụọ ụmụ karịa ole ha kwesiri ịmụ. Ụfọdụ ndị na-ekwetaghị ụdị mmekọ dị otu a na-anata ntaramahụhụ dị egwu n’ihi na a si na onye kweta ihe Onicha kwuru, ọ laa n’oge.

O nwere otu nwanyị di ya nwụrụ n’oge gboo, maka ọ jụrụ ịnabata nwoke ọbụna dịka enyi, ma zụkwaa ụmụ ya n’ụzọ nke Chineke ka ha jiri bochie ya ọnụ wee si na ọ bụ osu. Ha boro ya ebubo na ọ bụ osu n’obodo e si lụta ya. Nke a mere ka ndị nze na ọzọ si obodo nna ya bịa mee emume wee gosi ọha na eze na ada ha nwanyị bụ diala (nwaafọ). Otu a ka ọtụtụ ụmụnwanyị ajadu si nweta mmekpa ahụ dị iche iche n’aka ndị ọchọnganoko.

N’oge gboo, ajadu ọbụna na-agba nkpe, ya bụ iru ụjụ na-ata ahụhụ n’ala Igbo.Nke a na-apụta ihe n’ụzọ dị iche iche omenala si debe ọnọdụ ndị ajadu maka ịda ekpe.

GUO:  E meela emume icheta ụbọchị ndị ajadu

Elizabeth Ilonwa, onye nke si Okpuno kwuru n’obodo ya bụ Ebenebe, n’oge mbụ, na nwanyị di ya nwụrụ na-esonye usoro dị iche iche tupu o ruchaa ụjụ di ya. “Na mbụ, ọ ga-anọ abali iri na abụọ ya bụ izunatọ n’ekwughị okwu, nke pụtara na ya na mmadụ agaghị na-akpa nkata, onwekwaghị onye ga na-atụpụrụ ya ọnụ, ọgaghị asa ahụ, ọ gaghị ata atụ.

“Mgbe nke a gachara, ka e mechara omenala so ya, ọ ga-anọkwa izu asaa nke pụtara otu ọnwa, ọ manye akwa ojii nke ọ ga-eyi otu afọ”.

Otu a ka ọ dị n’obodo dị iche iche n’ala Igbo.Obodo ọbụna nwere usoro ha si eme nke ha. Ihe ndị a nile bụ iji hụ na nwanyị di ya lara mmụọ kwanyeere ya ugwu otu o kwesịrị na nghọta nke ha n’oge ahụ.
Ka o sila dị, ihe agbanweena, ndị ajadu e nweena ọnụ okwu ugbu a. Ndị ụka emeena ka mmegide e mere ndị ajadu bụrụ akụkọ mgbe ochie.

Ka ọ dị ugbu a, ma ndị ụka, gọọmentị na otu nnọọronwe dị iche iche na-enyezi ndị ajadu nwakdo n’ebe ọ dị ukwuu nke meziri na ndị ajadu e nweena otu nke jikọtara ha ọnụ, ebe ha na-anọ akpa maka ọ dị mma ha.

Mmadụ dị ndụ apụghị ịnarakwa ajadu ihe di ya n’ike ugbu a makana ihe adịghịzi ka ọ dị na mbụ. Ọnọdụ ndị ajadu gbanwere mezie na ajadu na-enwezi nkwuwa okwu nke mere na ndị mmadụ ụfodụ bidoziri inyo ụfọdụ ndị ajadu enyo ịmata ma ha ama ihe mere di ha. Nke a bụrụ ma okwu, bụrụ ma ilu.

GUO:  E meela emume icheta ụbọchị ndị ajadu

Ọtụtụ ndị mmadụ na-anwakwa ike ha na-ebe ndị ajadu nọ. Ụfọdụ oge, n’ihe dịka ekeresimesi ụfọdụ, ndị ọgaranya na-agbara ndị ajadu ekeresimesi site n’inye ha onyinye ego, akwa, ihe oriri na ọtụtụ onyinye dị iche iche.

Akụkọ kọrọ n’oge gara aga ka otu nwanyị di ya ka dị ndu si ga n’ebe a kpọrọ ndi ajadu oku, ka o ruru, o sooro ha kwụnye n’ahịrị. Ma mgbe di ya hụrụ ya, ọ gara metu ya aka jụọ ya ihe ọ kwụ ebe ahụ eme ebe ya bụ di ya ka dị ndụ. Ma ọ jụrụ di ya si, ‘”ihe a ị dị, ọ bụ ndụ?”

Ka ọ dị ugbu a, n’agbanyeghị na ihe agbanweena n’ebe ndị ajadu nọ, ọtụtụ n’ime ha jizi ọnọdụ ha dịka ajadu wee mere ihe irịọ arịrịọ. Ọ gakwuru mmadụ, ọ kọwaara ya na ya bụ nwanyị ajadu ka o nyere ya aka. Ọ dịghị otu a n’oge gboo, n’agbanyeghị na ndị ajadu na-agabiga mmekpa ahụ dị iche iche, ha gbakwara mbọ zụọ ụmụ ha site n’itinye aka n’ọlụ dị iche iche dịka ọlụ ugbo, ịzụ ahịa, ọlụ aka, ọlụ ego w.d.g.

Ndị ajadu n’oge gboo gbasiri ike ma dị uchu n’ọlụ ma n’oge ugbu a, n’ihi na ndị ajadu na-adazị ngana, Chi ụtụtụ fo, ọ nọrọ nkịtị, I kwuo, ọ si gị na ya bụ nwanyị ajadu.
Ajadu abụghị ọlụsi. Nke a mere na ajadu ọbụna ga-eke ajị n’ume, lụọ ọlụ dịịrị ya site n’ịzụ ụmụ ya maka otito nke Chukwu.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here