Emeela aha Fada Offor ka ọ dị ọkpụtọrọkpụ

0
828

‘BISHOP’ Jonas Benson Okoye, bụ onye enyemaka bishọpụ nke ụka Katọlik,Dayọsis Awka agoziela ma gbapee ogige a kpọrọ ‘Calvary Victorious Garden’ nke a lụrụ n’aha ‘Rev Fr’. Aniscetus Offor,nwaafọ Umuchu, onye lagoro mmụọ.

Ọ bụ Mazi na Oriaku Onyeka Francis Offor lụrụ ogige a na ‘St Pauls Catholic Church’, Achalla Umuchu, nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra.

Ha rụrụ ogige a iji wee mee ka aha nwanne ha nwoke bụ ‘Rev. Fr’. Anicetus Offor dị ọkpụtọrọkpụ. A mụrụ Fr. Offor ka ọnwa ‘April’ dị na mkpụrụ ụbọchị iri na iteghete n’afọ 1968 ma chie ya ụkọchukwu ka ọnwa Ọgọstụ dị na mkpụrụ ụbọchị iri na iteghete, n’afọ 1995. Ọ nwụrụ ka ọnwa Machị dị n’ụbọchị iri na asatọ n’afọ 1996, nke bụ ọnwa asaa e jiri chie ya ụkọchukwu. E liri ya na ‘St Patrick’s Cathedral, Awka n’Eprel, 1996.

Ka ọ na-agozi ogige a ‘ Most Rev’. Jonas Benson Okoye toro ezinaụlọ ndị be Offor, ọ kachasị Mazi na Oriaku Onyeka Offor, maka icheta nwanne ha nwoke bụ Fr Anicetus Offor, onye nke nwụrụ n’ike n’ihi ihe mberede nke okporo ụzọ.

Bishọpụ Okoye dụrụ ndị ụkọchukwu ọdụ ka ha na-adị njikere maka ọnwụ. Ọ rụtụkwara aka na Kraist nwụrụ ka ọ dị afọ iri atọ na atọ, nke pụtara afọ atọ o jiri malite ọlụ.

Ọ gakwara n’ihu dụọ ndị mmadụ ọdụ ka ha jiri ogige ahụ wee na-abịawanye Chineke nso.
Ụkọchukwu parish ahụ bụ ‘St Paul’s Catholic Church, Achalla Umuchu, bụ ‘Rev Fr’ Raph Agbanu, n’okwu nke ya, toro ndị rụrụ ogige ahụ ‘Calvary Garden’. Ọ gara n’ihu kọwaa na ebe a rụrụ ogige a bụbụ ebe a na-awụfu ahịhịa, ma ka ọ dị ugbu a ,e meela ya ebe a na-ekpe ekpere.

Ọ gwakara ndị parish ahụ ka ha were ogige ahụ kpọrọ ihe, ọ kachasi iji chetara onwe ha maka ahụhụ Kraist iji gbapụta ụwa na njọ.

Mazi Onyekachukwu Offor, onye rụrụ ogige ahụ kwuru na ọ bụ maka ime ka aha nwanne ha nwoke bụ Fr Anicetus Offor, onye nke nwụrụ afọ iri na atọ gara aga dị ọkpụtọrọkpụ.
Ọ gakwara n’ihu kwuo na ọ rụrụ ya iji kelee nwanne ya (fada) ahụ nwụrụ anwụ maka ihe ọma o mere ya n’afọ 2013. O kọwara na o kwetere na ọ bụ nwanne ya ahụ kpọgara ya ụlọọgwụ oge o nwere ihe mberede.

O kwuru na ogige ahụ ga-eme ka ụkọchukwu ahụ lara mmụọ dị ọkpụtọrọkpụ n’uche ndị mmadụ, ma ndị a ka ga-amụ amụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here